Missa Dị Asọ
MBIDO
N'aha Nna, na Nwa, na Mmụọ Nsọ.
Ndị mmadụ:
Amen.
Nke a gachaa,ụkọchukwu agbasaa aka ya, kelee ndị mmadụ sį:
Ka amara nke Onyenweanyị Jesu Kristi, na ịhụnanya nke Chukwu Nna, na mmekọrịta nke Mmụọ Nsọ, dịrị unu niile. Ndị mmadụ: Dirikwara mmụọ gị.
Ma obọ:
Ụko:
Ka amara na udo si na Chukwu Nna anyi na Onyenweanyį Jesu Kristi dirį unų.
Ndị mmadụ:
Dịrịkwara mmụọ gị.
Ma ọbụ:
Ụkọ:
Onyenweanyị nọnyere unu.
Ndị mmadụ:
Nọnyekwara mmụọ gị.
Kama ịsị
Onyenweanyị nọnyere unu,
Nnukwu Ụkọchukwu n'ekele mmalite ga-asị:
Nnukwu Ụkọ:
Udo dịrị unu.
Ndị mmadụ:
Dịrịkwara mmụọ gị.
Ụkọchukwu ma ọbụ onye Dikin, ma ọbụ ogbaodibo ọzọ nwere ike kọwaara ndįkwerenụ maka Misa a ga-edo ụbọchị ahụ na mkpụrụokwu olemaole.
EMUME NCHEGHARI
Ihe ọzọ na-esonụ bụ ụkọchukwu įkpọku ndịkwerenụ maka Emume Nchegharį:
Umunne m, iji kwadoo onwe anyį nke ọma maka emume iheomimi ndį a dį nsọ, ka anyį kweta na anyį emehiela, site n'ikwuputa njọ anyi ga.
A ga-agba nkįtį nwantįtį oge. E mechaa, mmadụ niile ekpekọọ ekpere nkwuputa njọ ọnụ:
Ekwupụta m gwa Chineke ji ike niile, na unu ụmụnne m; na emehiela m nke ukwuu, site n'echiche, na okwu, na omume, na site n'ihapụ eziomume kwesịrị na m ga-eme:
Ha a na-esu aka n'obi na-asi:
Site na mmehie m,Site na mmehie m, Site na mmehie m nke kacha ukwuu.
ekperekwa gawa:
Ya ka m ji arịọ Marịa dị Ngọzi, Vejin Okpu, na ndị Mmụọ ọma na Ndị nsọ niile, na unụ umụnne m, ka unu rịọwara m Oseburuwa Chukwu anyị arịrịo.
Ụkọchukwu ekpezie ekpere ntọhapụ
Ụkọ:
Ka Chineke ji ike niile meere anyị ebere, gbaghara anyị njọ anyị ga, wee duruo anyị na ndụ ebighiebi.
Ndị mmadụ:
Amen.
Ma ọbụ:
Ụkọ:
Onyenweanyị,meere anyị ebere.
Ndị mmadụ:
N'ihi na anyị emehiela Gị.
Ụkọ:
Onyenweanyị,gosi anyị ebere Gị.
Ndị mmadụ:
Nyekwuo anyị nzọpụta Gị.
Ụkọchukwu ekpezie ekpere ntọhapụ
Ụkọ
Ka Chineke ji ike niile meere anyị ebere, gbaghara anyị njọ anyị ga, wee duruo anyị na ndụ ebighiebi.
Ndị mmadụ:
Amen.
Ma ọbụ:
Ụkọ:
Gi, Onye e zitere ịgwọ obi chegharịrị echegharị: Onvenweanvi.mee ehere
Ndị mmadụ:
Onyenweanyi,mee ebere.
Ụkọ:
Gi, Onye biara ikpo ndi omenjo: Kristi, mee ebere.
Ndị mmadụ:
Kristi,mee ebere.
Ụkọ:
Gị, Onye nọ n'aka nrị Nna ịrịọtara anyị arịrịọ, Onyenweanyị,mee ebere.
Ndị mmadụ:
Onyenweanyị,mee ebere.
Ụkọchukwu ekpezie ekpere ntọhapụ
Ụkọ
Ka Chịneke ji ike nille meere anyị ebere, gbaghara anyị njọ anyị ga, wee duruo anyị na ndụ ebighjebi.
Ndị mmadụ:
Amen.
Aga-ekpezi
Onyenweanyị,mee ebere,
ma ọ bụrụ na e kpebeghį ya n'otu n'ime ụzọ ndįọzọ ahu e deputarala mnaka emume nchegharį.
V.
Onyenweanyị,mee ebere,
R.
Onyenweanyị,mee ebere,
V.
Kristi, mee ebere.
R.
Kristi, mee ebere.
V.
Onyenweanyị,mee ebere,
R.
Onyenweanyị,mee ebere,
Otito dįrį Chịneke n'elu kacha elu; Nụwa,udo dịrį ndį mmadụ ndį nwere obi ọma. Anyį ajaa Gį mma, anyį agọzie Gį, anyį esekpuoro Gį, anyį etoo Gį, anyį ekelee Gį n'ihi nnukwu ebube Gį, Oseburuwa Chukwu, Eze nke eluigwe, Chukwu Nna ji ike niile. Dinwenu Jesu Kristi, sọ otu Nwa Chineke mụrụ, Dinwenu Chukwu, Nwaatụrụ nke Chineke, Nwa nke Nna, Gi Onye na-ekpochapụ njọ nke ụwa, meere anyị ebere; Gi Onye na-ekpochapụ njọ nke ụwa, nara arịrịọ anyị. Gị Onye nọ n'aka nrị Nna, meere anyị ebere. N'ihi na sọ Gị dị Nsọ, sọ Gị bụ Dinwenu, sọ Gi, Jesu Kristi, kachasị dị elu, Gị na Mmụọ Nsọ: N'ebube Chukwu Nna. Amen.
Ukwe a gachaa, ụkọchukwu ejikọọ aka ya sị:
Ka anyị rịọ arịrịọ.
Ụkọchukwu na mmadụ niile ga-ewere obere ohere kpee ekpere imeobi. Ugbua,ụkọchukwu abịa gbasaa aka ya, kpee ekpere Nchịkọta; O kpechaa,ndị mmadụ ewelie olu zaa:
Amen.
EMUME NKE OKWU
Ugbu a, Ọgụịhe agawa na Ekwuokwu gụọ ịheọgụgụ Nke Mbụ, nke mmadụ niile ga-anọrọ ala gere.Iji gosi ngwụcha lheọgụgụ,ọgụịhe ewelie olu kwuo:
Okwu nke Oseburuwa.
Mmadụ niile azaghachi:
Ekele dịrị Chukwu.
Ọkwe abụọma maọbụ Obu ụzọ ukwe ekwee maọbụ gụpụta Abụọma. Ndị mmadụ ana-azaghachi Azịza. Nke a gachaa, ọ bụrụ na a ga-enwerịrị Ihe ọgụgụ Nke Abụọ, ọgụịhe ga-anọ na Ekwuokwu gụpụta ya, dị ka e mere n'Iheọgụgụ Nke Mbụ. ọ gụchaa,o welie olu kwuo:Okwu nke Oseburuwa.
Mmadụ niile azaghachi:
Ekele dịrị Chukwu.
Ịhe ga-esonụ bụ Aleluia, maọbụ ukwe ọzọ dį ka usoro iwu oge emume si nye ntuziaka.Ka nke a na-aga,ụkọchukwu etinye mgbaisiọma ma ọ bụrụ na e ji ya eme emume. Nke a gachaa,dikin ga-agụ Oziọma abia hulata ala nke ọma n'ihu ụkọchukwu, wetuo olu rịọ ngọzị si:Dikin:
Biko,Nna,gozie m.
ụkọchukwu ewetuo olu kwuo sį:
Ka Dinwenự nọrọ n'obi gį na n'egbugbereọnụ gį, ka I were ugwu kwuwaputa Oziọma Ya etu kwesįrį kwesį: N'aha Nna, na Nwa, na Mmựọ Nsọ.
Dikin adựọ akara nke obe,zaghachi:
Amen.
Mana ọ bựrự na dikin anọghį, ựkọchukwu ehulata ala n'ihu ekwuaja, kpee n'ime obi ya sį:
Chineke ji ike niile, nựchaa obi m na egbugbereonự m,ka m tosi iji ugwu kwuwaputa Ozioma Gį dį nsọ etu kwesirį ekwesį.
Nke a gachaa,dikin maọbự ựkọchukwu agaa na Ekwuokwu; ọ bựrự na o ji mkpa, ndi na-agba odibo ga-eburu mgbaisiọma na kandựl soro ya. O ruo ebe ahự,ọsį:Dikin/Ụkọ:
Onyenweanyį nọnyere unu.
Ndį mmadự:
Nọnyekwara mmựọ gį.
Dikin/Ụkọ:
Iheọgựgự nke a si n'Ozioma dį nsọ nke.. dere.
Ka ọ na-ekwu nke a, ọ mee akara nke obe n'elu akwựkwọ, mekwa n'egedege ihu,n'egbugbereọnự,na n'obi ya. Ndį mmadự ewelie olu zaghachį:
Otito dįrį Gį,Dinwenự.
Ọ bựrự na e bu mgbaisi ọma, dikin ma ọbự ựkọchukwu efee akwựkwọ mgbaisiọma wee kwuwaputa Oziọma. Dikin maọbự ựkọchukwu kwuwaputachaa Oziọma, o welie olu kwuo:
Oziọma nke Oseburuwa.
Mmadự niile azaghachi:
Otito dįrį Gį, Kristi.
Nke a gachaa, Dikin/Ụkọ. esusuo akwụkwọ ọnự,wetuo olu sį: Ka e site n'okwu nke Oziọma a guputara kpọchapụ njọ anyį. Nke a gachaa, okwuchukwu esote ya, nke ọ bụ iwu na ụkọchukwu maọbụ dikin ga-ekwuriri n'ụbọchį Sọndee niile, na kwa ụbọchį nsọpụrụ niile nke iwu; ọ bụkwa įhe dį mma ikwu ya n'ụbọchį ndį ọzọ. E kwuchaa okwuchukwu, o buru na iwu kwuru ya, a ga-ekwe maọbụ kwupụta Njirimaraokwukwe:
Ekwere m n'otu Chineke, Nna ji ike niile, Onye mnere eluigwe na ala, na ihe niile a pụru ihụ anya na ndị a pụghị ịhu anya. Ya na n'ótu Onyenweanyi,Jesu Kristi, sọ ótu Nwa Chineke muru, Nna muru tupu uwatuuwa niile. Chukwu si na Chukwu, ihè si n'ihè, Ezi Chukwu si n'Ezi Chukwu, a muru amu, e meghi eme, Ya na Nna bu otu ihe n'odidi ebighiebi ha jiri buru Chukwu: Onye e si na Ya mee ihe dum. Onye maka ihi anyi bu mmadu na maka ihi nzoputa anyi, siri n'eluigwe gbadata. E ruo n'okwu ndi a na-esote, mmadu niile ga-ehulata ruo na Q BURU MMADU. O WERE AHU NA VEJIN MARIA; SITE NA MMỤỌ NSỌ, Ọ BỤRỤ MMADỤ. A kpogbuo Ya n'obe n'ihi anyi n'oge ochichi Pontus Pailet; Ọ taa ahụhụ, nwuo, e lie Ya. Ma O bilitere n'ubọchị nke atọ, ka Akwukwo Nso si kwuo, O rogoro n'eluigwe, norọ n'akanri Nna. Ma Q ga-abiaghachi ozo n'ebube Ya, ikpe ndį dị ndụ na ndi nwuru anwu ikpe, Onye ochichi Ya na-enweghi njedebe. Ekwere m na Mmuo Nso, Dinwenu na Onye na-enye ndụ: Onye si na Nna na Nwa puta. Onye a na-esekpuru na-etokodo Ya na Nna na Nwa: Onye si na ndi amuma kwuo okwu. Ekwere m na Nzuko nke dị otu, dį nsọ, buru katolik na apostolik. Ekwuputa m otu mmirichukwu maka mgbaghara njo ga. Ana m atu anya mbilitenonwu ndi nwuru anwụ, na ndu uwa ga-abianu. Amen.
A bįa kpee ekpere ọha maọbụ ekpere ndikwerenụ.
EMUME YUKARISTIA
Ịhe ndį a gachaa,e bido ukwe onyinye. Ka a na-eme nke a, ndį ọgbaodibo ebute įhe ndį a n'elu ekwuaja: Akwandosahukristi, akwanhichaikonso, ikonsọ, mkpuchiikonsọ na Misalụ. ọ di mkpa ka ndikwerenu gosiputa na ha so achu aja site n'ibute achicha na mmanya maka emume nke Yukaristįa maọbụ onyinye ndį ọzọ e ji egbo mkpa nke Nzụkọ na nke ndį ogbenye. Ųkọchukwu, ka o kwụ n'ekwuaja, ga-ewere eferensọ achicha dị n'ime ya, were aka abụọ bulitetu ya elu, kwuo n'ime onwe ya:
Ụko:
Į dį ngọzį, Oseburuwa, Chineke nke ụwa niile, n'ihina ọ bụ n'uju afọọma Gį ka anyį siri nata achįcha nke a anyį na-ehunyere Gį, mkpụrụ si n'ala na akaorụ mmadų: ọ ga-aghọọrọ anyį achįcha nke ndụ.
E mechaa,ọ dowe eferensọ achįcha dį n'ime ya n'elu Akwandosahukristi.
Ma ọ bụrụ na a naghį ekwe ukwe onyinye, ukochukwu nwere ike welite olu kwuo okwu ndį a; na njedebe, ndį mmadụ nwere ike welte olu zaa:
Chineke,Į dį ngọzį ebighiebi.
Dikin maọbụ ụkọchukwu ga-agbanye mmanya na nwantįntį mmiri n'ikonsọ,kwuo n'ime onwe ya.
Site n'iheomimi nke mmiri na mmanya a, ka anyį keta oke n'įbụ Chukwu nke Onye ahụ weturu onwe Ya ikere oke n'odįdį anyį bụ mmadụ.
Nke a gachaa, ụkọchukwu eburu ikonsọ n'aka ya abụọ, bulitetu ya elu n'elu ekwuaja,kwuo n'ime onwe ya:
Į dį ngọzį, Oseburuwa, Chineke nke ụwa niile, n'ihi na ọ bụ n'uju afọọma Gị ka anyi siri nata mmanya nke a anyi na-chunyere Gi, mkpụrụ osisi vainį na akaorụ mmadụ: Q ga-aghọọrọ anyị ihe oñụñụ nke mmụọ.
Nke a gachaa, ya edowekwa ikonsọ n'elu akwvandosa. Ma ọ bụrụ na a naghi ekwe ukwe onyinye,ụkọchukwu nwere ike welite olu kpee ekpere a; ọ kpechaa, ndį mmadụ ewelite olu zaa:
Chįneke, į dį ngọzį ebighiebi.
Nke a gachaa, ụkọchukwu ehulataruo ala kwuo n'ime onwe ya:
Anyį ji umeala na obi loghara elogha na-arįo Gį, Dinwenu, ka į nabata anyį; meekwa ka aja anyį n'ihu Gį taa, masį Gį įnara, Dinwenụ Chineke.
ọ bụrụ na ọ dabara, ụkọchukwu ga-efe iheaja, obe na ekwuaja mgbaisi ọma.E mechaa,dikin maọbụ otu onye na ndį na-agba odibo ga-efezį ụkọchukwu na ndį mmadụ mgbaisiọma. E mechaa, ụkọchukwu eguzoro n'akọkọ ekwuaja kwoo aka, kwuo n'ime onwe ya:
Sachapụ m, Dinwenụ, na mmehie m, wụchapụtakwa m na njọ m.
E mechaa, ya eguzoro n'etiti ekwuaja chee ndį mmadụ ihu gbasaa aka, jikọkwaa ha,kwuo:
Rįọwa nụ, ụmụnne m: ka aja mụ na nke unu Bụrụ įhe ga-asọ Chukwu Nna ji ike niile inara.
Ndį mmadụ akwuru ọtọ zaghachi:
Ka Dinwenụ nara aja n'aka gį Maka ọjįjamma na ebube nke aha Ya, Maka ọdįmma nke anyį, Na nke Nzugbe Nzụkọ Ya dį nsọ.
Nke a gachaa, ụkọchukwu agbasaa aka ya, kpekwasa iheaja ekpere; ọ kpechaa, ndi mmadụ ewelie olu zaa:
Amen.
MMALITE EKPERE YUKARĮSTĮA
IZUGBE II