AGỌNYEERECHUKWU
MMALITE EKPERE YUKARỊSTỊA
AGỌNYEERECHUKWU
NDỤ NDỊ A GỌNYEERE CHUKWU DỊ KA ỊGBARA CHINEKE ODIBO
SITE N'INOMI KRISTI
V. Onyenweanyị nọnyere ụnụ.
R. Nọnyekwara mmụọ gị.
V. Welite nụ obi ụnụ elu.
R. Anyị ewelitela ha n'ebe Dinwenụ nọ.
V. Ka anyị nye nụ Dinwenụ Chukwu anyị ekele.
R. O kwesịrị, bụrụkwa ihe ziri ezi.
O kwesịrị ezie, bụrụkwa ihe ziri ezi, ọrụ dịịrị anyị,
na nzọpụta anyị,
na anyị ga-enye Gị ekele, oge niile,
na ebe niile, Dinwenụ, O Nna dị Nsọ,
Chineke ji ike niile, Onye dị ụwatụụwa,
sitena Kristi Dinwenụ anyị.
Onye, dika ifuru na-enweghị ntụpọ
sitéré na mgbọrọgwụ nke Vejin pụta,
kwupụtara ngọzi dịịrị ndị obi ha dị ocha
were sitekwa n'usoro ndụ ya kụzie ọkaibe ịdị ọcha dị nsọ.
Ọ gụrụ Ya agụụ ime uche Gị mgbe niile
hube isi ganye n'ọnwụ maka anyị
were họrọ ihunyere Gị Onwe Ya
dịka aja isiọma zuru oke.
Ọ gọnyere Gị ndị gbakụtagoro
ihe niile dị n'ụwa azụ n'ihi Gị,
ka ha were uchu fee ebubeeze Gị,
were mee ka ha jidewanye n'aka
na ha ga-enweta akụ nke eluigwe.
N'ihi nke a, anyị na-eso igwe ndị Mmụọọma
na ndị nsọ na-ekwe ukwe otito akwụsịghị akwụsị na-asị:
Nsọ, Nsọ, Nsọ Oseburụwa Chineke nke igwe ndị agha...