NDỊ NWỤRỤ ANWỤ III
MMALITE EKPERE YUKARỊSTỊA
NDỊ NWỤRỤ ANWỤ III
KRISTI : NZỌPỤTA NA NDỤ
A na-ekpe nke a na Misa maka ndị nwụrụ anwụ.
V. Onyenweanyị nọnyere ụnụ.
R. Nọnyekwara mmụọ gị.
V. Welite nụ obi ụnụ elu.
R. Anyị ewelitela ha n'ebe Dinwenụ nọ.
V. Ka anyị nye nụ Dinwenụ Chukwu anyị ekele.
R. O kwesịrị, bụrụkwa ihe ziri ezi.
O kwesịrị ezie, bụrụkwa ihe ziri ezi, ọrụ dịịrị anyị,
na nzọpụta anyị,
na anyị ga-enye Gị ekele, oge niile,
na ebe niile, Dinwenụ, O Nna dị Nsọ,
Chineke ji ike niile, Onye dị ụwatụụwa,
site na Kristi Dinwenụ anyị.
Onye bụ Nzọpụta nke ụwa,
Ndụ mmadụ na Mbilitenọnwụ ndị nwụrụ anwụ.
Site na Ya ka igweagha ndị Mmụọọma
na-añụrị ebighịebi n'ihu Gị, ji esekpuru ebubeeze Gị.
Anyị na-arịọ ka I kwe ka anyị tinyekọọ olu anyị na nke ha,
were oke ọñụ na-asị :
Nsọ, Nsọ, Nsọ Oseburụwa Chineke nke igwe ndị agha...