NDỊ APỌSTỤL I
MMALITE EKPERE YUKARỊSTỊA
NDỊ APỌSTỤL I
NDI APỌSTỤL DỊKA NDỊNCHEATỤRỤ NDỊ NKE CHUKWU
A na-ekpe nke a na Misa nke Ndị Apọstụl, o kachasị na nke Pita na Pọl dị nsọ.
V. Onyenweanyị nọnyere ụnụ.
R. Nọnyekwara mmụọ gị.
V. Welite nụ obi ụnụ elu.
R. Anyị ewelitela ha n'ebe Dinwenụ nọ.
V. Ka anyị nye nụ Dinwenụ Chukwu anyị ekele.
R. O kwesịrị, bụrụkwa ihe ziri ezi.
O kwesịrị ezie, bụrụkwa ihe ziri ezi, ọrụ dịịrị anyị,
na nzọpụta anyị,
na anyị ga-enye Gị ekele, oge niile,
na ebe niile, Dinwenụ, O Nna dị Nsọ,
Chineke ji ike niile, Onye dị ụwatụụwa :
Onyencheatụrụ dị ebighịebi,
Ị naghị agbahapụ igwe atụrụ Gị,
kama I ji nchekwaba dị ọkpụ
na-eduzi ya site n'aka Ndị Apọstụl dị ngọzi,
ka ndị na-achịkwaba ya
bụrụkwa otu ndị ahụ I mere
ndịncheatụrụ nọchitere anya Nwa Gị.
N'ihi nke a,
Anyị na-eso ndị Mmụọọma, na ndị Isịmmụọọma,
Ukpoeze na Ikeọchịchị,
nakwa igwe ndịagha niile nke eluigwe,
na-ekweukwe otito Gị akwụsịghị akwụsị, na-asị :
Nsọ, Nsọ, Nsọ Oseburụwa Chineke nke igwe ndị agha...