Ụka Ngọzị
Nedụ Achįcha n'enye ndụ
Nedụ Achįcha n'enye ndụ n'emeghe ọnụzọ eluigwe,
Ndį iro ji iwe na esodo anyį,Nye anyį ike nyere anyį aka
Otito ọkpụ dįrį Dinwenụ,Onye dį otu gbakwazį atọ,
Onye n'enye ndụ n'enwerọ ube N'eluigwe obodo anyį. Amen.
Isi ala na ikpere ala
Isi ala na ikpere ala ka anyį n'etiri Sakramentį ukwu
Mana emume nke dį ọ hụrụ Nọchiri anya aja nke ochie
Okwukwe n'emeju ihe ike ntį na anya enweghį ike įnye
Otito na ngọzį dįrį Nna na Nwa Ngọzį ndụ ike n'ebube dįazįrį Ya
Otito dį enu dįkwazįrį Ya Onye si na Nna na Nwa pụta.Amen.
Ọnyere ha achįcha si n'eluigwe
(Alleluia)
Nke bụ sọ ụtọ na mma
(Alleluia)
O Dinwenụ, onye hapụrụ anyį na sakramentį nkea dį įtụnanya ncheta nke ahụhụ Gį; Nye anyį, anyį na arįọ Gį, nsọ pụrụ nke ihe omimi nke ahụ na ọbara Gį,nke ga-eme k'anyį nweta elele nzọpụta Gį. Onye di ndụ na-achį ebebe ebebe.Amen.
Ngọzį dįrį Chukwu
Ngọzį dįrį Chukwu
Ngọzį dįrį aha nsọ Nke Chukwu
Ngọzį dįrį jesu Kristi bụrụkwa mmadụ ezie
Ngọzį dįrį aha nsọ nke Jesu
Ngọzį dįrį obi Jesu dįkasįrį na nsọ
Ngọzį dįrį ọbara ya kasi oke ọnụ
Ngọzį dįrį Jesu na sakramentį dįkasįrį nsọ nọ na altar
Ngọzį dįrį Chukwu Mmụọ-Nsọ Onye nkasį obi.
Ngọzį dįrį nne nke Chukwu dį ebube bụ Marįa dįkasįrį ns asọ
Ngọzį dįrį įtụ ime ya dį asọ na ejighi njọ.
Ngọzį dįrį mbugo n'eluigwe ya dį otito.
Ngọzį dįrį aha nke Marįa bụ Vejin na Nne.
Ngọzį dįrį Josefụ dįkasįrį obi ọcha bụ di ya
Ngọzį dįrį Chukwu na ebe ndį Mmụọ-ọma na ndį ọma nọ
Kristi emeriwo
Kristi n'achį,
Kristi n'echi eze.
Ka anyi sekpuelunu ebebe,Sakramentį nke kachasį dį asọ, Tobenu Dinwenu mba nile, Madụ nile tobe Dinwenụ Maka na o gosigo ebere Ya
n'ebe anyį nọ, Na eziokwu nke Dinwenụ ga-adį ọkpụ Otito dįrį Nna na Nwa na Mmụọ- Nsọ, Etu odįrį n'izizi na kita n'ekpo nile n'ụwa ebebe.
Amen