OMỤMỤ ONYENWEANYỊ I
MMALITE EKPERE YUKARỊSTỊA
OMỤMỤ ONYENWEANYỊ I
A na-ekpe nke a na Misa niile nke ụbọchị oriri ọmụmụ Onyenweanyị na n'ụbọchị ọbụla n'ime izuemumeabaliasatọ ya. A na-ekpekwa ya n'ụbọchị ndị na-esote ya; ọbụladị na Misa ndị nwere Mmalite Ekpere Yukarịstịa nke aka ha, beeresọ na Misa ndi nwere Mmalite Ekpere Yukarịstịa nke aka ha metụtara iheomimi dị na Chukwu, maọbụ iheomimi nke Onweonye dị n'Otu Chineke; ya nakwa n'ụbọchị nkịtị dị n'oge mmemme ọmụmụ Onyenweanyị.
V. Onyenweanyị nọnyere ụnụ.
R. Nọnyekwara mmụọ gị.
V. Welite nụ obi ụnụ elu.
R. Anyị ewelitela ha n'ebe Dinwenụ nọ.
V. Ka anyi nye nụ Dinwenụ Chukwu anyị ekele.
R. O kwesịrị, bụrụkwa ihe ziri ezi.
O kwesịrị ezie, bụrụkwa ihe ziri ezi, ọrụ dịịrị anyị,
na nzọpụta anyi,
na anyị ga-enye gị ekele, oge niile,
na ebe niile, Dinwenụ, O Nna dị Nsọ,
Chineke ji ike niile, Onye dị ụwatụụwa.
N'ihi na site n'iheomimi nke Okwuemereahụ,
Ìhè ọhụrụ nke ebube Gị achawabatala
n'ime anya nke mmụọ anyị,
ka o wee bụrụ
na anyị na-amata Chukwu n'ụdị a na-ahụ anya,
Site na ya, ịhụnanya maka ihe mmụọ anyị anaghị ahụ anya
ana-eri anyị obi.
N'ihi nke a,
Anyị na-eso ndị Mmụọọma na Ndịisi Mmụọọma,
ha na Ukpoeze,
Ikeọchịchị na igwe ndịagha niile nke eluigwe,
na-ekwe ukwe otito Gị ebighịebi, na-asị :
Nsọ, Nsọ, Nsọ Oseburụwa Chineke nke igwe ndị agha...
Ọ bụrụ na a ga-ekpe Ekpere Yukarịstịa nke Rom,a ga-ekpekwa Ekpere Mmekọrịta Anyị na Ndị Nsọ pụrụ iche dị ka o siri dị n'ihuakwụkwọ ...
Na Misa Nche na nke Etitiabalị Ọmụmụ Dinwenụ, a ga-ekpe :..Na mmemme anyasị a kachasịnsọ...
Bidozie n'ụtụtụ ya na n'ime izuemumeabaliasatọ a, a ga-ekpe... Na mmemme ụbọchị taa kachasị nsọ..