OGE ỌPỊPỊA ỤBỌCHỊ IRI ANỌ I
MMALITE EKPERE YUKARỊSTỊA
OGE ỌPỊPỊA ỤBỌCHỊ IRI ANỌ I
MPỤTARA IMEMMỤỌ ΝKE ΟGE ỌPỊPỊA ỤBỌCHỊ IRI ANỌ
A na-ekpe nke a n'oge Ọpịpịa Ụbọchị Iri Anọ, ma ọ kacha ụbọchị Sọndee mgbe a na-enweghị ike ikpe Mmalite Ekpere Yukarịstịa ọzọ.
V. Onyenweanyị nọnyere ụnụ.
R. Nọnyekwara mmụọ gị.
V. Welite nụ obi ụnụ elu.
R. Anyị ewelitela ha n'ebe Dinwenụ nọ.
V. Ka anyị nye nụ Dinwenụ Chukwu anyị ekele.
R. O kwesịrị, bụrụkwa ihe ziri ezi.
O kwesịrị ezie, bụrụkwa ihe ziri ezi, ọrụ dịịrị anyị,
na nzọpụta anyị,
na anyị ga-enye Gị ekele,oge niile,
na ebe niile, Dinwenụ,O Nna dị Nsọ,
Chineke ji ike niile, Onye dị ụwatụụwa,
site na Kristi Dinwenụ anyị.
N'ihi na, n'afọ ọbụla,
I ji afọọma na-eme ka ndị kwere na Gị
were ọñụ sitere na mmụọ a wụchara awụcha
na-atụ anya maka mmemme iheomimi nke Ngafere;
ka ọ ga-abụ, site n'itinyekwu uchu n'ịdị nsọ kwesịrị ha,
na kwa n'ọrụ nke ịhụnanya,
na sitekwa n'isonye ugboro ugboro n'emume iheomimi
Nke e si na ya mụgharịa ha,
e dubanye ha n'uju amara nke ịbụ ụmụ.
N'ihi nke a,
Anyị na-eso ndị Mmụọọma na na ndị Isi mmụọọma,
Ha na Ukpoeze,
Ikeọchịchị na igwe ndịagha niile nke eluigwe,
na-ekwe ukwe otito Gị ebighịebi, na-asị :
Nso,Nso,Nso Oseburuwa Chineke nke igwe ndi agha...