EKPERE YUKARỊSTỊA III
EKPERE YUKARỊSTỊA III
V. Onyenweanyị nọnyere ụnụ.
R. Nọnyekwara mmụọ gị.
V. Welite nụ obi ụnụ elu.
R. Anyị ewelitela ha n'ebe Dinwenụ nọ.
V. Ka anyị nye nụ Dinwenụ Chukwu anyị ekele.
R. O kwesịrị, bụrụkwa ihe ziri ezi.
A ga-ekpezi Mmalite Ekpere Yukarịstịa dika usoro iwu sị dị, nke ga-emechị etu a:
Nsọ, Nsọ, Nsọ Oseburụwa Chineke nke igwe ndị agha.
Eluigwe na ala jụpụtara n'ebube Gị.
Hozana n'elu kacha elụ.
O dị ngọzị bụ Onye bịara n'aha Onyenweanyị.
Hozana n'elụ kacha elụ.
Ụkọchukwu agbasaa aka ya sị:
Dinwenụ, Ị dị nsọ n'ezie,
Ọ kwesịrị ekwesi etu ihe niile I kere eke sị eto Gị.
site na Nwa Gị Dinwenụ anyị Jesu Kristi,
na site n'ọrụ na n'ike nke Mmụọ Nsọ,
I na-enye ihe niile ndụ na-edo ha nsọ,
Ị naghị akwụsị Ịkpọkọbara Onwe Gị
Ndị mmadụ ka o wee bụrụ na
site n'owụwaanyanwụ rụọ n'ọdịda ya,
a ga na-ehụnyere Aha Gị iheonyinye dị ocha.
O jikọọ aka ya abụọ setipụ ha n'elu iheaja, na-ekwu sị:
Ya mere, anyị jizi umeala arịọ Gị Dinwenụ,
ka Ọ masị Gị, site n'ike nke otu Mmụọ ahụ,
Ịgọzi onyinye ndị a anyị buteere Gị ka e doo nsọ
O jikoo aka ya bịa mekwasa achicha na ikonso akara nke obe otu ugboro na-asi
n'otu mgbe ahu:
Ka ha ghọọrọ anyị Ahụ na Ọbara Nwa Gị
Dinwenụ anyị Jesu Kristi
O jikọọ aka ya
Onye Ọ bụ site n'iwu Ya
ka anyị na-eme mmemme iheomimi ndị a.
N'okwu ndị na-esonụ, a ga-ekwupụta mkpụrụokwu nke Dinwenụ n'ụzọchawapụrụ achawapụ, doro anya, dika ụdị okwu ndị ahụ kwesịrị
N'anyasị a raara Ya nye
Ọ ga-ewere achịcha, welite ya elu nwantịntị n'elu ekwuaja na-ekwu sị:
O weere achịcha, ka Ọ na-enye Gị ekele, Ọ gọzie, nyawaa,nyekwa ya ụmụazu Ya, na-asị :
O hulata nwantịntị
NARA NỤ NKE A, RIE NỤ YA ỤNỤ NIILE:
NKE A BỤ AHỤ M,
NKE A GA-EDURU NYE MAKA ỤNỤ.
Ọ ga-egosị ndị mmadụ iheaja e doro nsọ, weghachikwa ya n'efereaja gbuokwa ikpere, sekpuo.
E mechaa, Ọ kwuru na-aga:
Otu ahu kwa ka O siri mee mgbe e richara nri anyasị
Ọ ga-eburu ikonsọ welite ya elu nwantịntị n'elu ekwuaja kwuru na-aga:
O buuru ikonsọ, ka Ọ na-enyekwa Gị ekele, Ọ gọzie ya, bunyekwa ya ụmụazụ Ya, na-asị:
O hulata nwantịntị
NARA NỤ NKE A, ÑỤỌ NỤ YA, ỤNỤ NIILE:
NKE A BỤ IKONSỌ NKE ỌBARA M,
NKE ỌGBỤGBANDỤ ỌHỤRỤ DỊ EBIGHỊEBI,
A GA-AGBA YA N'IHI ỤNỤ,
NA N'IHI IMERIME MMADỤ
KA E WERE GBAGHARA NJỌ GA,
NA-EME NỤ NKE A NA NCHETA NKE M.
O gosị ndị mmadụ ikonsọ dowe ya n'elu akwandosa Ahụ Kristi,
gbuokwa ikpere, sekpuo ya.
] Oga-ekwuzi sị:
Iheomimi nke okwukwe
Ndị mmadụ agaa n'ihu na-ekwụwaputa:
Anyị na-ekwusa ọnwụ Gị
na-ekwupụtakwa mbilitenọnwụ Gị,
O Dinwenụ, wee ruo mgbe Ị ga-abịa.
Maọbụ:
Oge ọbụla anyị na-eri achịcha nke a,
na-añụ ikonsọ nke a,
anyị na-ekwusa ọnwụ Gị,
O Dinwenụ, Wee ruo mgbe ị ga-abịa.
Maọbụ:
Onyenzọpụta nke ụwa, biko zọpụta anyị :
Gị bụ Onye sitere n'obe na
na mbilitenọnwụ Gị tọhapụ anyị
E mechaa, Ụkọchukwu agbasaa aka ya na-ekwu sị:
Dinwenụ, ebe anyị na-echeta
ahụhụọnwụ na-enye ndụ nke Nwa Gị ahụ
na mbilitenọnwụ Ya dị ịtụnanya
na nrogoro n'eluigwe Ya,
ebe anyị nọkwa na-atụ anya ọbịbịa nke abụọ Ya,
anyị ji obi ekele na-achụnyere Gị,
Aja nke a dị ndụ, Aja dị nsọ.
Anyi ji umeala arịọ
ka I lekwasị anya n'onyinye nke Nzukọ Gị,
ka I na-ahụ ya ka Iheaja
nke Ọ masịrị Gị ka nhunye ya medaa Gị obi,
mee ka, anyị bụ ndị e ji Ahu na Obara Nwa Gị azụ nri,
jupụtachaa na Mmụọ Nsọ Ya,
anyị abụru otu ahu na otu mmụọ n'ime Kristi.
Ka Ya Onwe Ya were anyị nye Gị dị ka aja dị ọkpụ,
ka anyị nwee ike soro ndị nke Gị Ị họtara
keta oke n'ekpe.
Na mbụ, Vejin Marịa dịkarịsịrị ngọzi, Nne nke Chukwu
na Josef dị ngọzi bụ di ya,
na Ndịapọstụl Gị dị ngọzi
na ndị e gburu maka okwukwe dị otito
(naonye di nso .. Onye nsọ a na-eri oriri ya maọbụ onye nsọ
onyenche Ụlọ Nzukọ)
na ndi nso niile,
ndị anyị tụkwasara obi na arịrịọ ha n'ihu Gị mgbe niile
ga-enyere anyị aka.
Anyị ji umeala arịọ, O Oseburụwa,
ka iheaja nke ndoziagbata anyị a
wetawanyere ụwa niile udo na nzọpụta.
Ka Ọ masị Gị ime ka Nzukọ Gị nọ n'ije n'ụwa
Kwụsie ike n'okwukwe na n'ịhụnanya,
ya na nwa odibọ Gị Poopu anyị...
na Bishọpụ anyị (*) ... na ọda ndị Bishopụ
na ndị echiriechi niile,
na ndị nke Gị niile a gbatara Gị.
N'obiọma, Gị nụrụ arịrịọ ndị ezinaụlọ a
Ndị ọ masịrị Gị ka ha kwụrụ n'ihu Gị.
were ebere kpokọtara onwe Gị
ụmụ Gị gbasara n'ụwa niile, O Nna nwere obiọma.
+ Nabata n'alaeze Gị,
ụmụnne anyị ndị nwụrụ anwụ na ndị niile hapụrụla ụwa a
ndi mere ihe masịrị Gị,
ebe anyị na-atụ anya na anyị ga-anọ
nweta afọ ojuju ebighịebi site n'otito Gị,
O jikọọ aka ya.
Site na Kristi Dinwenụ anyị,
Onye I si na Ya agbasapụ aka enye ụwa ihe ọma niile.
O were efereaja iheaja dị n'ime ya na ikonsọ bulite ha elu kwuo sị:
Site na Ya bụ Kristi
na n'isonye Ya
na kwa n'ime Ya
na n'ịdịkọ n'otu nke Mmụọ Nsọ
ka nsọpụrụ na otito niile si adịrị Gị
Chukwu Nna ji ike niile
site n'ụwatụwa niile.
Ndị mmadụ anakwee: Amen!
Mgbe a na-ekpe Ekpere Inye Ekele nke a na Misa ndị nwụrụ anwụ, e nwere ike kpee nke a:
+ Cheta nwaodibọ Gị (Aha)...
onye I si n'ụwa a kpọrọ
ka ọ biakwute Gị (n'ụbọchị taa).
Ebe e jikọtara ya na Nwa Gị n'oyiyi ọnwụ Ya,
mee, ka ya na Nwa Gị ahụ bụrụ otu na mbilitenọọnwụ Ya.
Mgbe Ọ ga-esi n'ala
kulite ndị nwụrụ anwụ n'anu ahụ,
bịa gbanwokwa ahụ anyị na-adịghị ike
ka Ọ dị ka nke Ya dị ebube.
Nabata n'alaeze Gị ụmụnne anyị
Ndị nwụrụ anwụ na ndi niile hapụrụla ụwa a
Ndị mere ihe masịrị Gị,
ebe anyị na-atụ anya na anyị ga-anọ
nweta afọ ojuju ebighịebi site n'otito Gị.
Mgbe ahụ ga-ehichapụ anya mmiri niile n'anya anyị,
makana, anyị na-ahụ Gị bụ Chukwu anyị anya
ka I si dị n'onwe Gị,
anyị ga na-adị ka Gị ụwataụwa
bịa na-eto Gị akwụsịghị akwụsị.
O jikọọ aka ya
Site na Kristi Dinwenụ anyị
Onye I si na Ya agbasapụ aka enye ụwa ihe ọma niile.
EMUME ORIRINSỌ
E dobechaa ikonsọ na efereaja, Ụkọchukwu e jikọọ aka ya ọnuọ sị:
Ebe e nyerela anyị iwu na-enye ndụ,
Anyị abụrụkwa ndị e ji nkụzi nke Chineke were zụọ,
ka anyị were nụ nkamobi kpee:
Ọ gbasaa aka ya, ya na ndị mmadụ ekpee:
Nna anyị nọ n'eluigwe
Ka otito dịrị Aha Gị,
Ka ọchịchị Gị bịa
Ka e mee uche Gị n'ụwa
Ka e sị eme ya n'eluigwe
Nye anyị tata nri nke ụbọchị anyị
Gbaghara anyị mmehie anyị ga
Dịka anyị sị gbaghara ndị mehiere anyị
Ekwela ka anyị kwenye na nlanye,
Ma zọpụta anyị n'ajọ ihe.
Ụkọchukwu gbasaa aka ya, o kwuo sị:
Zọpụta anyị, anyị na-arịọ
O Oseburụwa, n'ajọ ihe niile;
were ebere nye udo n'oge nke anyị.
Site n'inye aka ebere Gị,
ka a zọpụta anyị na njọ oge niile,
anyị ewere gbalahụ nsogbu niile,
were nchekwube dị nsọ na-atụ anya
maka mbịaghachị nke Onyenzọpụta anyị, Jesu Kristi.
O jikọọ aka yā.
Ndị mmadụ eweta ekpere na njedebe na kwee:
N'ihi na ọchịchị, ike na otito
bụ nke Gị, ebighịebi ebighịebi.
E mechaa, Ụkọchukwu agbasaa aka ya kwuwapụta ọfụma, sị:
Onyenweanyị Jesu Kristi,
Ị gwara ndị Apọstụl Gị:
udo ka m na-ahapụrụ ụnụ,
udo nke m ka m na-enye ụnụ:
E lekwala anya na njọ anyị ga,
kama n'okwukwe nke Nzukọ Gị;
nye Ya udo na ịdịkọ n'otu
ka uche Gị siri chọọ
O jikọọ aka ya
Gị bụ Onye dị ndụ na-achị
Ebighịebi ebighịebi.
Ndị mmadụ azaa: Amen.
Ụkọchukwu, echee ndị mmadụ ihu, gbasaa aka ya, jikọta ya wee gbakwunye sị:
Udo nke Oseburụwa dịịrị ụnụ mgbe niile
Ndị mmadụ azaa: Dịịrịkwa mmụọ Gị.
E mechaa, Ọ bụrụ na ọ dabara, Dikin maọbụ Ụkọchukwu agbakwunye:
Nyerịta nụ ibe ụnụ ekele nke udo!
Mmadụ niile, dị ka ndị sị eme, enyerịta ibe ha ekele nke udo orikọ na ịhụnanya; Ụkọchukwu enye Dikin maọbụ onye na-agba odibọ.
E mechaa o were achịcha nyawaa ya n'elu efereaja, tinye iberibe ya n'ime ikonsọ wetuo olu kwuo sị:
Ka njikọ Ahụ na Ọbara Onyenweanyị Jesu Kristi
wetaara anyị bụ ndị ga-anata Ya ndụ ebighịebi.
Mgbe nke a na-eme,a na-ekwe maọbụ na-ekwu:
Nwaatụrụ nke Chukwu Onye na-ekpochapụ njọ ga nke ụwa:
meere anyị ebere.
Nwaatụrụ nke Chukwu Onye na-ekpochapụ njọ ga nke ụwa:
meere anyị ebere.
Nwaatụrụ nke Chukwu Onye na-ekpochapụ njọ ga nke ụwa:
Nye anyị udo.
E nwere ike kwunwokwaa nke a imerime oge ma Ọ bụrụ na nnyawa achịcha were ogologo oge mana n'ikpeazụ a ga-ekwurịrị: Nye anyị udo.
E mechaa Ụkọchukwu ejikọọ aka ya, wetuo olu ya sị:
Dinwenụ Jesu Kristi,
Nwa nke Chukwu dị ndụ,
Onye si n'uche Nna,
na n'ọrụ nke Mmụọ Nsọ,
nye ụwa ndụ site n'ọnwụ Gị:
Zọpụta m, site n'Ahụ na Ọbara Gị nke a kacha nsọ,
na njọ niile na ajọ ihe niile.
Mee ka m kwụdosie ike n'iwu Gị mgbe niile
e kwekwala ka m kewapụ onwe m n'ebe Ị nọ.
Maọbụ:
Dinwenụ Jesu Kristi,
ka oriri Ahụ na Ọbara Gị,
ghara ịbụrụ m ikpe na amamikpe.
Ma site n'obiebere Gị,
ka Ọ bụụrụ m nchedo nke mmụọ na nke ahụ
na ihe na-eweta ọgwụgwọ.
Ụkọchukwu egbuo ikpere n'ala, were iheaja n'elu efereaja maọbụ n'elu ikonsọ, welite ya nwantịntị, che ndị mmadụ ihu, kwuwapụta, sị:
Lee Nwaatụrụ nke Chukwu
Lee Onye na-ekpochapụ njọ nke ụwa.
Ha dị ngọzị bụ ndị a kpọrọ
n'oriri nke Nwaatụrụ Chineke.
Ụkọchukwu ewetuo olu, ya na ndị mmadụ ekwuo otu ugboro sị:
Dinwenụ, etosighị m ka Ị bata n'ụlọ m
ma kwuo sọ okwu
a ga-agwọ mkpụrụobi m.
Ụkọchukwu echee ekwuaja ihu wetuo olu kwuo sị:
Ka Ahụ Kristi chekwaba m ruo na ndụ ebighịebi.
O were nsọpụrụ nata Ahụ Kristi. Nke a gachaa, o buru ikonsọ wetuo olu sị:
Ka Ọbara Kristi chekwaba m ruo na ndụ ebighịebi.
O were nsọpụrụ ñụọ Ọbara Kristi. Nke a gachaa o buru efereaja maọbụ ọkwa oriri nsọ gakwuru ndị ga-anata oriri welite oriri nsọ elu nwantịntị gosị onye ọbụla ọ ga-enye na-asị:
Ahụ Kristi.
Onye ga-anata oriri nsọ azaa: Amen.
Ọ natazịa oriri nsọ.
Otu ihe ahụ ka Dikin ga-eme ma ọ bụrụ na ọ na-eke oriri nsọ.
Ọ bụrụ na o nwere ndị ga-anata oriri nsọ n'ụdị naabọ, a ga-eso usoro dị ka ọ dị ebe a kọwapụtara ya.
Ka ụkọchukwu na-anata Ahụ Kristi, e bido ukwe oriri nsọ.
E kechaa oriri nsọ, Ụkọchukwu maọbụ Dikin maọbụ Akọlaịt ehichanye efereaja n'ime ikonsọ ma jichakwaa ikonsọ n’onwe ya. Mgbe ụkọchukwu na-eme nhicha, ọ ga- ewetu olu kpee:
Dinwenụ, ka anyị were obi ọcha
nabata ihe anyị jigoro ọnụ anyị wee rie
ka o sikwuazi n'onyinye na-agafe agafe
bụụrụ anyị ihe ọgwụgwọ ga-adị ebighịebi.
Ụkọchukwu nwere ike ịloghachi n'oche. Ohere dị, ndị mmadụ anọrọ jụụ maọbụ kwee abụọma maọbụ ukwe otito maọbụ ukwe ọzọ.
E mechaa,Ụkọchukwu akwụru n'ekwuaja maọbụ n'oche ya, chee ndị
mmadụ ihu jikọọ aka ya si:
Ka anyị rịọ arịrịọ
Mmadụ niile na Ụkọchukwu ekpee ekpere imeobi nwantịntị oge. Ma Ọ bụrụ na e meela nke a mbụ, ọ dịkwaghị mkpa. Nke a gachaa, Ụkọchukwu agbasaa aka ya kpee ekpere anatachaa oriri. Ndị mmadụ anakwee:
Amen.
EMUME MMECHI
Ugbu a, a ga-ama obere ọkwa ma Ọ bụrụ na e nwere ha.
Nke a gachaa,a ga-enwe mgbasa. Ụkọchukwu echee ndị mmadụ ihu, gbasaa aka
kwuo sị:
Onyenweanyị nọnyere ụnụ.
Ọha mmadụ azaghachị : Nọnyekwara mmụọ gị.
Ụkọchukwu agọzie ọha mmadụ kwuo sị:
Ka Chukwu ji ike niile gọzie ụnụ
Nna na Nwa na Mmụọ Nsọ.
Ọha mmadụ azaghachi: Amen.
N'ụbọchị maọbụ emume ụfọdụ tupu e nyee ngọzi a, a na-ebu ụzọ nwee usoro ngozi ozọ ka nwee ugwu maọbụ arịrịọ n'isi ọha mmadụ dị ka usoro emume siri hazie.
Na misa nnukwu Ụkọchukwu na-ekwu ọ ga-ekpuru okpu ukwu ya gbasaa aka sị:
Onyenweanyị nọnyere ụnụ.
Ọha mmadụ azaa: Nọnyekwara mmụọ gị.
Onyeisi emume ekwuo sị:
Ka ngọzi dịrị aha nke Osebụrụwa.
Oha mmadụ azaa: Site ugbu a ruo mgbe ebighịebi.
Onyeisi emume ekwuo sị:
Enyemaka anyị dị n'aha Onyenweanyị
Ọha mmadụ azaa : Onye mere eluigwe na ala.
Mgbe onye na-eme emume nara mkpọ (ma ọ bụrụ na eji ya), ọ sị,
Ka Chineke ji ike niile gọzie ụnụ,
Mgbe ọ na-emekwasa ndị mmadụ akara nke obe ugboro atọ,
Ọ ga-ekwu sị:
Nna na Nwa na Mmuo Nso.
Ọha mmadụ azaa: Amen.
E mechaa, Dikin maọbụ Ụkọchukwu n'onwe ya ejikọọ aka ya chee ndị mmadụ ihu sị:
Lawa nụ Misa agwụsigo.
Ọha mmadụ azaghachi : Ekele dịrị Chukwu.
Maọbụ:
Lawa nụ gaa kwusawa Oziọma nke Dinwenụ.
Maọbụ:
Lawa nụ n'udo, were nụ ndụ ụnụ tobe Dinwenụ.
Maọbụ:
Lawa nụ n'udo.
Ọha mmadụ azaghachi: Ekele dịrị Chukwu.
E mechaa, Ụkọchukwu ewere nsọpụrụ susuo ekwuaja ọnụ dịka dị ka ndị si eme, ka o si mee na mbido Misa.
N’ikpeazụ zi, Ụkọchukwu apụta n'ihu ckwuaja, ya na ndị na-agba odibọ ehulataruo isi
ala wee pụwazia.
Ọ bụrụ na e nwere emume ofifennu ọzọ na-esote ozigbo, a ga-ahapụ Emume Mgbasa.