ỌMỤMỤ ONYENWEANYỊ II
MMALITE EKPERE YUKARỊSTỊA
ỌMỤMỤ ONYENWEANYỊ II
IDOGHACHI IHE NILE N'IME MWEREAHỤ
36. A na-ekpe nke a na Misa niile nke ụbọchi oriri Ọmụmụ Onyenweanyi na n'ụbọchị ọbụla n'ime izuemumeabaliasatọ ya. A na-ekpekwa ya n'ụbọchị ndị na-esote ya; ọbụladị na Misa ndị nwere Mmalite Ekpere Yukarịstịa nke aka ha, beeresọ na Misa ndị nwere Mmalite Ekpere Yukarịstịa nke aka ha metụtara iheomimi dị na Chukwu, maọbụ iheomimi nke Onweonye dị n'Otu Chineke; ya nakwa n'ụbọchi nkịtị dị n'oge mmemme Ọmụmụ Onyenweanyi.
V. Onyenweanyị nọnyere ụnụ.
R. Nọnyekwara mmụọ gị.
V. Welite nụ obi ụnụ elu.
R. Anyị ewelitela ha n'ebe Dinwenụ nọ.
V. Ka anyị nye nụ Dinwenụ Chukwu anyị ekele.
R. O kwesịrị, bụrụkwa ihe ziri ezi.
O kwesịrị ezie, bụrụkwa ihe ziri ezi, ọrụ dịịrị anyị,
na nzọpụta anyị,
na anyị ga-enye Gị ekele, oge niile,
na ebe niile, Dinwenụ, O Nna dị Nsọ,
Chineke ji ike niile, Onye dį ụwatụụwa,
site na Kristi Dinwenụ anyị.
Onye a pụghị ihụ anya n'ụdị nke Ya
Gosịrị onwe Ya n'ụdị anyị a pụrụ ịhụ anya
n'iheomimi nke a kwesịrị nsọpụrụ anyị na-eri oriri Ya.
Onye a mụrụ tupu ụwatụwa, bidoro dịwa n'oge,
ka O site n'ibulite n'ime onwe Ya ihe niile dara ada,
wee weghachi okike niile n'ozuzuoke,
bịa kpọghachi mmadụ furu efu n'alaeze eluigwe.
N'ihi nke a,
Anyị na-eso ndị Mmụọọma niile
na-ekwe ukwe otito Gị n'emume obiụtọ na-asị :
Nsọ, Nsọ, Nsọ Oseburụwa Chineke nke igwe ndị agha...
Ọ bụrụ na a ga-ekpe Ekpere Yukarịstịa nke Rom, a ga-ekpekwa Ekpere Mmekọrịta Anyị na Ndị Nsọ
pụrụ iche dị ka o siri dị n'ihuakwụkwọ...
Na Misa Nche na nke Etitiabalị ọmụmụ Dinwenụ, a ga-ekpe:...Na mmemme anyasị a kachasị nso...
Bidozie n'ụtụtụ ya na n'ime izuemumeabaliasatọ a, a ga-ekpe ...Na mmemme ụbọchị taa kachasị nsọ...