EKPERE YUKARỊSTỊ II
EKPERE YUKARỊSTỊ II
Ọ bụ eziokwu na Ekpere Yukarịstịa nke a nwere mmalite Ekpere Yukarịstịa nke aka ya, ma e nwekwara ike ikpekọta Ya na mmalite Ekpere Yukarịstịa ndị ọzọ chịkọtara akụkọ lhe omimi nke nzọpụta. Ọmụmaatụ: Nke Izugbe.
V. Onyenweanyị nọnyere ụnụ.
R. Nọnyekwara mmụọ gị.
V. Welite nụ obi ụnụ elu.
R. Anyị ewelitela ha n'ebe Dinwenụ nọ.
V. Ka anyị nye nụ Dinwenụ Chukwu anyị ekele.
R. O kwesịrị, bụrụkwa ihe ziri ezi.
O kwesịrị ezie, bụrụkwa ihe ziri ezi, ọrụ dịịrị anyị,
na nzọpụta anyị,
na anyị ga-enye Gị ekele, oge niile,
na ebe niile, Dinwenụ, O Nna dị Nsọ,
site na Nwa Gị Ị hụrụ n'anya bụ Jesu Kristi :
Okwu Gị I si na Ya mee ihe dum,
Onye I zitere ka Ọ bụrụ anyị
Onyenzọpụta na Onye Mgbapụta,
O weere ahụ site na Mmụọ Nsọ,
a mụọ Ya na Vejin.
N'imejupụta uche Gị,
na ịgbatara Gị ndị nke Gị dị nsọ.
Ọ gbasara aka n'ahụhụọnwụ
iji dọbie ụdọ nke ọnwụ na igosịpụta mbilitenọnwụ.
N'ihi nke a,
anyị na-eso ndị Mmụọọma na ndị Nsọ niile,
na-ekwupụta ebube Gị, were otu olu na-asị:
Nsọ, Nsọ, Nsọ Oseburụwa Chineke nke igwe ndị agha...
Ụkọchukwu agbasaa aka ya sị:
Ị dị nsọ ezie, Dinwenụ, bụrụ Isiiyi nke adịmnsọ ọbụla.
O jikọọ aka ya abụọ setịpụ ha n'elu iheaja, na-ekwu sị:
Ya mere, anyị na-arịọ ka I doo onyinye ndị a nsọ,
site n'ikukwasa ha mmụọ Gị,
O jikoo aka ya bia mekwasa achịcha na ikonsọ akara nke obe otu
ugboro na-asị n'otu mgbe ahụ:
Ka ha wee ghọọrọ anyị Ahụ * na Ọbara
nke Onyenweanyị Jesu Kristi.
O jikọọ aka
N'okwu ndị na-esonụ, a ga-ekwupụta mkpụrụokwu nke Dinwenụ n'ụzọ chawapụrụ achawapụ, doro anya, dịka ụdị okwu ndị ahụ kwesịrị:
Onye, mgbe O kwetere ka e dunye Ya n'ahụhụọnwụ
Ọ ga-ewere achịcha, welite ya elu nwantịntị n'elu ekwuaja na-ekwu sị:
Weere achịcha, ka Ọ na-enye ekele, nyawaa ya,
nyekwa ya ụmụazụ Ya, na-asị :
O hulata nwantịntị
NARA NỤ NKE A, RIE NỤ YA ỤNỤ NIILE:
NKE A BỤ AHỤ M,
NKE A GA-EDURU NYE MAKA ỤNỤ.
Ọ ga-egosị ndị mmadụ iheaja e doro nsọ, weghachikwa ya n'efereaja gbuokwa
ikpere sekpuo.
Mgbe o mechara nke a, o kwuru na-aga:
Otu ahụ kwa ka O siri mee, mgbe e richara nri anyasị
Ọ ga-eburu ikonsọ welite ya elu nwantịntị n'elu ekwuaja kwuru na-aga:
O buuru ikonsọ, ka Ọ na-enyekwa ekele,
bunye ya ụmụazụ Ya, na-asị :
O hulata nwantịntị
NARA NỤ NKE A, ÑỤO NỤ YA, ỤNỤ NIILE:
NKE A BỤ IKONSỌ NKE ỌBARA M,
NKE ỌGBỤGBANDỤ ỌHỤRỤ DỊ EBIGHỊEBI,
A GA-AGBA YA N'IHI ỤNỤ,
NA N'IHI IMERIME MMADỤ
KA E WERE GBAGHARA NJỌ GA,
NA-EME NỤ NKE A NA NCHETA NKE M.
O gosị ndị mmadụ ikonsọ, dowe ya n'elu akwandosa Ahụ Kristi, gbuokwa
ikpere, sekpuo.
Ọ ga-ekwuzi sị:
Iheomimi nke okwukwe
Ndị mmadụ agaa n'ihu na-ekwuwapụta:
Anyị na-ekwusa ọnwụ Gị
na-ekwupụtakwa mbilitenọnwụ Gị,
O Dinwenụ, wee ruo mgbe Ị ga-abịa.
Maọbụ :
Oge ọbụla anyị na-eri achịcha nke a,
na-añụ ikonsọ nke a,
anyị na-ekwusa ọnwụ Gị,
O Dinwenụ,Wee ruo mgbe Ị ga-abịa.
Maọbụ:
Onyenzọpụta nke ụwa, biko zọpụta anyị:
Gị bụ Onye sitere n'obe na
na mbilitenọnwụ ị tọhapụ anyị.
Nke a gachaa, ụkọchukwu agbasaa aka ya na-ekwu sị:
Dinwenụ, ebe anyị na-echeta ọnwụ na mbilitenọnwụ Ya
Anyị ehunyere Gị achịcha nke ndụ
na ikonsọ nke nzọpụta
na-enye Gị ekele
n'ihi na Ị gụnyere anyị
na ndị tosịrị ịkwụrụ n'ihu Gị na-efe Gị.
Anyị ji umeala arịọ
ka anyị bụ ndị na-eketa oke n'Ahụ na Ọbara Kristi
bụrụ ndị a ga-ekpokọba ọnụ site na Mmụọ Nsọ.
Dinwenụ, cheta Nzukọ Gị gbasara n'ụwa niile
mee ka o zuo oke n'ịhụnanya
ya na Poopu anyị ... na Bishopụ anyị (*) ...
na ndị echirechi niile.
Na Misa maka ndị nwụrụ anwụ e nwere ike gbakwụnye
Cheta nwaodibọ Gị(Aha)...
onye I si n'ụwa a kpọrọ
ka ọ bịakwute Gị (n'ụbọchị taa).
Ebe e jikọtara ya na Nwa Gị n'oyiyi ọnwụ Ya
mee ka ya na Ya bụrụ otu na mbilitenọọnwụ Ya.
Chetakwuazi ụmụnne anyị
Ndị ji nchekwube nke mbilitenọnwụ rahụ ụra
were ebere kpọbata ha
Na ndị ọzọ niile nwụrụ anwụ n'ihe nke ihu Gị.
Anyị arịọ ka I meere anyị niile ebere
ka anyị soro Vejin Marịa dị Ngọzi Nne nke Chukwu,
nakwa Josef dị ngọzi bụ di ya,
Ndịapọstụl dị ngọzi na Ndịnsọ niile
Ndị mere uche Gị kemgbe ụwatụụwa
keta ekpe ndụ ebighịebi
ka anyị sorokwa ha na-eto Gị na-edo Gị ebube,
O jikọọ aka ya
Site na Jesu Kristi Nwa Gị.
O were efereaja iheaja dị n'ime ya na ikonsọ bulite ha elu kwuo Sị :
Site na Ya bụ Kristi
na n'isonye Ya
na kwa n'ime Ya
na n'ịdịkọ n'otu nke Mmụọ Nsọ
ka nsọpụrụ na otito niile sị adirị Gị
Chukwu Nna ji ike niile
site n'ụwatụwa niile.
Ndị mmadụ anakwee : Amen!
EMUME ORIRINSỌ
E dobechaa ikonsọ na efereaja, Ụkọchukwu e jikọọ aka ya ọnuọ sị:
Ebe e nyerela anyị iwu na-enye ndụ,
Anyị abụrụkwa ndị e ji nkụzi nke Chineke were zụọ,
ka anyị were nụ nkamobi kpee:
Ọ gbasaa aka ya, ya na ndị mmadụ ekpee:
Nna anyị nọ n'eluigwe
Ka otito dịrị Aha Gị,
Ka ọchịchị Gị bịa
Ka e mee uche Gị n'ụwa
Ka e sị eme ya n'eluigwe
Nye anyị tata nri nke ụbọchị anyị
Gbaghara anyị mmehie anyị ga
Dịka anyị sị gbaghara ndị mehiere anyị
Ekwela ka anyị kwenye na nlanye,
Ma zọpụta anyị n'ajọ ihe.
Ụkọchukwu gbasaa aka ya, o kwuo sị:
Zọpụta anyị, anyị na-arịọ
O Oseburụwa, n'ajọ ihe niile;
were ebere nye udo n'oge nke anyị.
Site n'inye aka ebere Gị,
ka a zọpụta anyị na njọ oge niile,
anyị ewere gbalahụ nsogbu niile,
were nchekwube dị nsọ na-atụ anya
maka mbịaghachị nke Onyenzọpụta anyị, Jesu Kristi.
O jikọọ aka yā.
Ndị mmadụ eweta ekpere na njedebe na kwee:
N'ihi na ọchịchị, ike na otito
bụ nke Gị, ebighịebi ebighịebi.
E mechaa, Ụkọchukwu agbasaa aka ya kwuwapụta ọfụma, sị:
Onyenweanyị Jesu Kristi,
Ị gwara ndị Apọstụl Gị:
udo ka m na-ahapụrụ ụnụ,
udo nke m ka m na-enye ụnụ:
E lekwala anya na njọ anyị ga,
kama n'okwukwe nke Nzukọ Gị;
nye Ya udo na ịdịkọ n'otu
ka uche Gị siri chọọ
O jikọọ aka ya
Gị bụ Onye dị ndụ na-achị
Ebighịebi ebighịebi.
Ndị mmadụ azaa: Amen.
Ụkọchukwu, echee ndị mmadụ ihu, gbasaa aka ya, jikọta ya wee gbakwunye sị:
Udo nke Oseburụwa dịịrị ụnụ mgbe niile
Ndị mmadụ azaa: Dịịrịkwa mmụọ Gị.
E mechaa, Ọ bụrụ na ọ dabara, Dikin maọbụ Ụkọchukwu agbakwunye:
Nyerịta nụ ibe ụnụ ekele nke udo!
Mmadụ niile, dị ka ndị sị eme, enyerịta ibe ha ekele nke udo orikọ na ịhụnanya; Ụkọchukwu enye Dikin maọbụ onye na-agba odibọ.
E mechaa o were achịcha nyawaa ya n'elu efereaja, tinye iberibe ya n'ime ikonsọ wetuo olu kwuo sị:
Ka njikọ Ahụ na Ọbara Onyenweanyị Jesu Kristi
wetaara anyị bụ ndị ga-anata Ya ndụ ebighịebi.
Mgbe nke a na-eme,a na-ekwe maọbụ na-ekwu:
Nwaatụrụ nke Chukwu Onye na-ekpochapụ njọ ga nke ụwa:
meere anyị ebere.
Nwaatụrụ nke Chukwu Onye na-ekpochapụ njọ ga nke ụwa:
meere anyị ebere.
Nwaatụrụ nke Chukwu Onye na-ekpochapụ njọ ga nke ụwa:
Nye anyị udo.
E nwere ike kwunwokwaa nke a imerime oge ma Ọ bụrụ na nnyawa achịcha were ogologo oge mana n'ikpeazụ a ga-ekwurịrị: Nye anyị udo.
E mechaa Ụkọchukwu ejikọọ aka ya, wetuo olu ya sị:
Dinwenụ Jesu Kristi,
Nwa nke Chukwu dị ndụ,
Onye si n'uche Nna,
na n'ọrụ nke Mmụọ Nsọ,
nye ụwa ndụ site n'ọnwụ Gị:
Zọpụta m, site n'Ahụ na Ọbara Gị nke a kacha nsọ,
na njọ niile na ajọ ihe niile.
Mee ka m kwụdosie ike n'iwu Gị mgbe niile
e kwekwala ka m kewapụ onwe m n'ebe Ị nọ.
Maọbụ:
Dinwenụ Jesu Kristi,
ka oriri Ahụ na Ọbara Gị,
ghara ịbụrụ m ikpe na amamikpe.
Ma site n'obiebere Gị,
ka Ọ bụụrụ m nchedo nke mmụọ na nke ahụ
na ihe na-eweta ọgwụgwọ.
Ụkọchukwu egbuo ikpere n'ala, were iheaja n'elu efereaja maọbụ n'elu ikonsọ, welite ya nwantịntị, che ndị mmadụ ihu, kwuwapụta, sị:
Lee Nwaatụrụ nke Chukwu
Lee Onye na-ekpochapụ njọ nke ụwa.
Ha dị ngọzị bụ ndị a kpọrọ
n'oriri nke Nwaatụrụ Chineke.
Ụkọchukwu ewetuo olu, ya na ndị mmadụ ekwuo otu ugboro sị:
Dinwenụ, etosighị m ka Ị bata n'ụlọ m
ma kwuo sọ okwu
a ga-agwọ mkpụrụobi m.
Ụkọchukwu echee ekwuaja ihu wetuo olu kwuo sị:
Ka Ahụ Kristi chekwaba m ruo na ndụ ebighịebi.
O were nsọpụrụ nata Ahụ Kristi. Nke a gachaa, o buru ikonsọ wetuo olu sị:
Ka Ọbara Kristi chekwaba m ruo na ndụ ebighịebi.
O were nsọpụrụ ñụọ Ọbara Kristi. Nke a gachaa o buru efereaja maọbụ ọkwa oriri nsọ gakwuru ndị ga-anata oriri welite oriri nsọ elu nwantịntị gosị onye ọbụla ọ ga-enye na-asị:
Ahụ Kristi.
Onye ga-anata oriri nsọ azaa: Amen.
Ọ natazịa oriri nsọ.
Otu ihe ahụ ka Dikin ga-eme ma ọ bụrụ na ọ na-eke oriri nsọ.
Ọ bụrụ na o nwere ndị ga-anata oriri nsọ n'ụdị naabọ, a ga-eso usoro dị ka ọ dị ebe a kọwapụtara ya.
Ka ụkọchukwu na-anata Ahụ Kristi, e bido ukwe oriri nsọ.
E kechaa oriri nsọ, Ụkọchukwu maọbụ Dikin maọbụ Akọlaịt ehichanye efereaja n'ime ikonsọ ma jichakwaa ikonsọ n’onwe ya. Mgbe ụkọchukwu na-eme nhicha, ọ ga- ewetu olu kpee:
Dinwenụ, ka anyị were obi ọcha
nabata ihe anyị jigoro ọnụ anyị wee rie
ka o sikwuazi n'onyinye na-agafe agafe
bụụrụ anyị ihe ọgwụgwọ ga-adị ebighịebi.
Ụkọchukwu nwere ike ịloghachi n'oche. Ohere dị, ndị mmadụ anọrọ jụụ maọbụ kwee abụọma maọbụ ukwe otito maọbụ ukwe ọzọ.
E mechaa,Ụkọchukwu akwụru n'ekwuaja maọbụ n'oche ya, chee ndị
mmadụ ihu jikọọ aka ya si:
Ka anyị rịọ arịrịọ
Mmadụ niile na Ụkọchukwu ekpee ekpere imeobi nwantịntị oge. Ma Ọ bụrụ na e meela nke a mbụ, ọ dịkwaghị mkpa. Nke a gachaa, Ụkọchukwu agbasaa aka ya kpee ekpere anatachaa oriri. Ndị mmadụ anakwee:
Amen.
EMUME MMECHI
Ugbu a, a ga-ama obere ọkwa ma Ọ bụrụ na e nwere ha.
Nke a gachaa,a ga-enwe mgbasa. Ụkọchukwu echee ndị mmadụ ihu, gbasaa aka
kwuo sị:
Onyenweanyị nọnyere ụnụ.
Ọha mmadụ azaghachị : Nọnyekwara mmụọ gị.
Ụkọchukwu agọzie ọha mmadụ kwuo sị:
Ka Chukwu ji ike niile gọzie ụnụ
Nna na Nwa na Mmụọ Nsọ.
Ọha mmadụ azaghachi: Amen.
N'ụbọchị maọbụ emume ụfọdụ tupu e nyee ngọzi a, a na-ebu ụzọ nwee usoro ngozi ozọ ka nwee ugwu maọbụ arịrịọ n'isi ọha mmadụ dị ka usoro emume siri hazie.
Na misa nnukwu Ụkọchukwu na-ekwu ọ ga-ekpuru okpu ukwu ya gbasaa aka sị:
Onyenweanyị nọnyere ụnụ.
Ọha mmadụ azaa: Nọnyekwara mmụọ gị.
Onyeisi emume ekwuo sị:
Ka ngọzi dịrị aha nke Osebụrụwa.
Oha mmadụ azaa: Site ugbu a ruo mgbe ebighịebi.
Onyeisi emume ekwuo sị:
Enyemaka anyị dị n'aha Onyenweanyị
Ọha mmadụ azaa : Onye mere eluigwe na ala.
Mgbe onye na-eme emume nara mkpọ (ma ọ bụrụ na eji ya), ọ sị,
Ka Chineke ji ike niile gọzie ụnụ,
Mgbe ọ na-emekwasa ndị mmadụ akara nke obe ugboro atọ,
Ọ ga-ekwu sị:
Nna na Nwa na Mmuo Nso.
Ọha mmadụ azaa: Amen.
E mechaa, Dikin maọbụ Ụkọchukwu n'onwe ya ejikọọ aka ya chee ndị mmadụ ihu sị:
Lawa nụ Misa agwụsigo.
Ọha mmadụ azaghachi : Ekele dịrị Chukwu.
Maọbụ:
Lawa nụ gaa kwusawa Oziọma nke Dinwenụ.
Maọbụ:
Lawa nụ n'udo, were nụ ndụ ụnụ tobe Dinwenụ.
Maọbụ:
Lawa nụ n'udo.
Ọha mmadụ azaghachi: Ekele dịrị Chukwu.
E mechaa, Ụkọchukwu ewere nsọpụrụ susuo ekwuaja ọnụ dịka dị ka ndị si eme, ka o si mee na mbido Misa.
N’ikpeazụ zi, Ụkọchukwu apụta n'ihu ckwuaja, ya na ndị na-agba odibọ ehulataruo isi
ala wee pụwazia.
Ọ bụrụ na e nwere emume ofifennu ọzọ na-esote ozigbo, a ga-ahapụ Emume Mgbasa.