N'OGE ỌPỊPỊA ỤBỌCHỊ IRI ANỌ II ỤBỌCHỊ ONYENWEANYỊ
MMALITE EKPERE YUKARỊSTỊA
ỤBỌCHỊ ONYENWEANYỊ
N'OGE ỌPỊPỊA ỤBỌCHỊ IRI ANỌ II
MGBANWO ỤDỊDỊ NKE ONYENWEANYỊ
A na-ekpe nke a n'ụbọchị a gụrụ ozịọma banyere mgbanwo ụdị nke Onyenweanyị, ma ọbụghị nke a, e were mmalite ekpere Yukarịstịa nke oge Ọpịpịa Iri Anọ I maọbụ II
V. Onyenweanyị nọnyere ụnụ.
R. Nọnyekwara mmụọ gị.
V. Welite nụ obi ụnụ elu.
R. Anyị ewelitela ha n'ebe Dinwenụ nọ.
V. Ka anyi nye nụ Dinwenụ Chukwu anyị ekele.
R. O kwesịrị, bụrụkwa ihe ziri ezi.
O kwesịrị ezie, bụrụkwa ihe ziri ezi, ọrụ dịịrị anyị,
na nzọpụta anyị,
na anyị ga-enye Gị ekele, oge niile,
na ebe niile, Dinwenụ, O Nna dị Nsọ,
Chineke ji ike niile, Onye dị ụwatụụwa,
Site na Kristi Dinwenụ anyị.
Onye, mgbe Ọ gwachagoro ndị ụmụazụ ya maka ọnwụ Ya,
kpugheere ha ebube nke Ya n'ugwu dị nsọ
ka O wee doo ha anya na Ya onwe Ya
ga-esite n'ahụhụ banye n'otito nke Mbilitenọnwụ;
dị ka iwu na ndị amụma siri gbaa akaebe.
N'ihi nke a,
anyị bụ ndị nọ n'ụwa na-eso
Ike niile nke eluigwe na-eto Gị,
na-etiku ebubeeze Gị mgbe niile, na-asị :
Nsọ, Nsọ, Nsọ Oseburuwa Chineke nke igwe ndị agha...