EKPERE YUKARỊSTỊA IV
EKPERE YUKARỊSTỊA IV
N'ihi ụdị Ekpere Inye Ekele a nke bụ nchịkọta Akụkọ Nzọpụta, a
machibidoro igbanwo Mmalite Ekpere Yukarịstịa nke a.
V. Onyenweanyị nọnyere ụnụ.
R. Nọnyekwara mmụọ gị.
V. Welite nụ obi ụnụ elu.
R. Anyị ewelitela ha n'ebe Dinwenụ nọ.
V. Ka anyị nye nụ Dinwenụ Chukwu anyị ekele.
R. O kwesịrị, bụrụkwa ihe ziri ezi.
O kwesịrị ezie na a ga-enye Gị ekele
Bụrụkwa ihe ziri ezi na a ga na-eto Gị, O Nna dị nsọ
n'ihi na sọ Gị bụ otu Chukwu, dị ndụ, bụ ezie,
Onye dị tupu ụwatụwa, dịkwa ebighịebi,
biri n'ihe e nweghị ike ịkpụdebe nso.
Sọ Gị dị mma bụrụkwa Isiiyi nke ndụ,
I kere ihe niile ka I mee ka ngọzi Gị
Jupụta ihe niile I kere eke,
meekwa ka ha niile ñụrịa na nchawapụta nke ihe Gị.
N'ihi nke a,
Igwe ndị Mmụọma enweghị ike ịgụta ọnụ
kwụ n'ihu Gị, na-efe Gị uchichi na ehihie,
ka ha na-esekpuru ebube ihu Gị,
ha na-eto Gị akwụsịghị akwụsị.
Site n'olu anyị, anyị na ha
na ihe dum e kere eke dị n'okpuru igwe
ji ọñụ na-ekwuwapụta Aha Gị,
ka anyị na-ekwe:
Nsọ, Nsọ, Nsọ Oseburụwa Chineke nke igwe ndị agha...
Ụkọchukwu agbasaa aka ya,si:
Nna dị nsọ, anyị na-eto Gị n'ihi na Ị dị ukwuu,
I jikwa amamihe na ihụnanya rụọ ọrụ Gị niile.
I kere mmadụ n'oyiyi Gị,
Bịa were nchekwa ihe niile dị n'ụwa tinye ya n'aka,
ka ọ ga-abụ ọ na-efe sọ Gị bụ Onye Okike,
Ọ bụrụ onye na-achị ihe niile e kere eke.
Mgbe ya bụ mmadụ tụfuru adịmma Gị na ya
site na nnupụisi,
Ị hapụghị ya n'ọchịchị nke ọnwụ
n'ihi na I ji ebere enyere mmadụ niile aka
ka Ọ ga-abụ mgbe ha chọwara Gị, ha achọta Gị.
Ugboro ugboro ka I nyere ndị mmadụ ohere ọgbụgbandụ
Bịakwa site n'ọnụ ndị amụma
Kụziere ha ịtụ anya nzọpụta.
Ị hụrụ ụwa n'anya nke ukwuu, O Nna dị nsọ,
nke na mgbe oge zuru
I ziteere anyị sọ otu Nwa Gị ka Onyenzọpụta.
Onye weere ahụ site na Mmụọ Nsọ,
a mụọ Ya na Vejin Marịa;
O ketara oke n'ọnọdụ anyị
n'ihe niile beeresọ njọ.
O wetaara ndị ogbenye ozịọma nke nzọpụta
mee ka ndị e ji eji nwere onwe ha
mee ka ndị nọ n'uru nwewe añụrị.
Iji mejupụta atụmaatụ Gị,
O weere onwe Ya nye n'ọnwụ,
ka O si n'ọnwụ bilite,O bibiri ọnwụ
bịakwa mee ndụ ka Ọ dị ghụrụ.
Ka anyị ghara ibizi ndụ maka onwe anyị
kama ka anyị biwezie maka Ya bụ onye nwụrụ anwụ
ma kulitekwa n'ọnwụ maka anyị,
O siri n'aka Gị, O Nna,
zitere ndị kwerenụ Mmụọ Nsọ, dịka mkpụrụmbụ,
Onye Ga-emejupụta ịdịnsọ niile,
ka Ọ na-eme ka ọrụ Ya zuo oke n'ụwa.
O jikọọ aka ya gbasaa ha n'elu iheaja na-ekwu sị:
Ya mere anyị ji arịọ Gị, Dinwenụ,
ka Ọ masị otu Mmụọ Nsọ ahụ
ido onyinye ndị a nsọ
O jikọọ aka ya bịa mekwasa achịcha na ikonsọ akara nke obe otu
ugboro na-asị n'otu mgbe ahụ:
Ka ha wee ghọọ Ahụ na Ọbara
nke Onyenweanyị Jesu Kristi
O jikọọ aka ya
Na mmemme nnukwu iheomimi nke a
nke Ya onwe Ya hapụụrụ anyị
ka ọgbụgbandụ dị ebighịebi.
N'okwu ndị na-esonụ, a ga-ekwupụta mkpụrụokwu nke Dinwenụ n'ụzọ chawapụrụ achawapụ, doro anya, dika ụdị okwu ndị ahụ kwesịrị:
Mgbe oge ruru na Ọ ga-anata otito n'aka Gị,
O Nna dị nsọ,
ebe Ọ hụrụla ndị nke Ya nọ n'ụwa n'anya,
Ọ hụrụ ha n'anya ruo n'isi njedebe :
Ka ha nọ na nri anyasị
O ga-ewere achịcha, welite ya elu nwantịntị n'elu ekwuaja na-ekwu sị:
O weere achịcha, gọzie ma nyawaa,
nyekwa ya ụmụazụ Ya, na-asị:
O hulata nwantịntị
NARA NỤ NKE A, RIE NỤ YA ỤNỤ NIILE:
NKE A BỤ AHỤ M,
NKE A GA-EDURU NYE MAKA ỤNỤ.
Ọ ga-egosị ndị mmadụ achịcha e doro nsọ tinye ya n'efereaja
gbuokwa ikpere sekporo ya.
Mgbe o mechara nke a, o kwuru na-aga:
N'otu aka ahụ
O buru iko welite ya elu nwantịntị n'ekwuaja gụrụ na-aga:
Ka O buuru ikonsọ, mmanya Vaịnị jupụtara,
O nyere ekele, bunyekwa ụmụazu Ya, na-asị:
O hulata nwantinti
NARA NỤ NKE A, ÑỤỌ NỤ YA, ỤNỤ NIILE:
NKE A BỤ IKONSỌ NKE ỌBARA M,
NKE ỌGBỤGBANDỤ ỌHỤRỤ DỊ EBIGHỊEBI,
A GA-AGBA YA N'IHI ỤNỤ,
NA N'IHI IMERIME MMADỤ
KA E WERE GBAGHARA NJỌ GA,
NA-EME NỤ NKE A NA NCHETA NKE M.
O gosị ndị mmadụ ikonsọ dowe ya n'elu akwandosa Ahụ Kristi,
gbuokwa ikpere, sekpuoro ya.
Ọ ga-ekwuzi sị:
Iheomimi nke okwukwe
Ndị mmadụ agaa n'ihu na-ekwuwapụta:
Anyi na-ekwusa ọnwụ Gị
na-ekwupụtakwa mbilitenọnwụ Gị,
O Dinwenu,wee ruo mgbe I ga-abia.
Maọbu:
Oge ọbụla anyị na-eri achịcha nke a,
na-añụ ikonsọ nke a,
anyị na-ekwusa ọnwụ Gị,
O Dinwenụ, Wee ruo mgbe Ị ga-abia.
Maobu:
Onyenzọpụta nke ụwa, biko zọpụta anyị:
Gị bụ Onye sitere n'obe na
na mbilitenọnwụ Gị tọhapụ anyị.
E mechaa,ukochukwu agbasaa aka ya na-ekwu sj:
N'ihi nke a, O Dinwenụ,
ebe anyị na-eme emume ncheta mgbapụta anyị ugbua,
anyị na-echetakwa ọnwụ Kristi
na nzida O zidara n'ala ndị nwụrụ anwụ,
na-ekwupụta mbilitenọnwụ Ya
na nrogoro Ya n'aka nri Gị
anyị nọkwa na-atụ anya mbịaghachi Ya n'otito,
anyị na-ehụnyere Gị Ahụ na Ọbara Ya
Aja na-amasị Gị, nke bụ maka nzọpụta uwa niile.
Dinwenụ, lekwasị anya n'iheaja
nke Gị Onwe Gị kwadobeere Nzukọ Gị
were obi ebere mee ka ndị niile ga-eketa oke
n'otu achịcha na ikonsọ nke a,
e kpokọba ha ọnụ n'otu ahụ site na Mmụọ Nsọ,
ha abụrụ iheaja dị ndụ n'ime Kristi
maka otito nke ebube Gị.
Ya bu, ugbu a,Dinwenụ,
cheta ndị niile anyị ji maka ha ehunyere Gị iheonyinye nke a,
ma Ọ kacha nwaọdibọ Gị Poopu anyị…..,
Bishọpụ anyị(*) ..., na ọda ndị bishọpụ niile,
tinyere izugbe ndị echiriechi,
ndị na-achụ aja a,
ndị niile nọrubere ebe a,
ndị nke Gị niile
na ndị niile bụ ndị ji ezi obi achọ Gị.
Chetakwuazi ndị nwụrụ n'udo Kristi Gị
na ndi niile nwụrụ anwụ
ndị Ọ bụ sọ Gị maara okwukwe ha.
Nna nwere obiọma, meenụ ka anyị niile
bụ ụmụ Gị tosị isoro Vejin Marịa,
bu Nne nke Chukwu
nakwa Josef dị ngọzi bụ di ya,
na Ndịapọstụl na ndị nsọ Gị
keta oke n'ekpe nke eluigwe n'alaeze Gị,
ebe anyị na ihe niile e kere eke
a dọpụtarala n'ure nke njọ na ọnwụ,
ga-enwe ike na-eto Gị
site na Kristi Dinwenụ anyị.
O jikọọ aka ya
Onye I si na Ya agbasapụ aka enye ụwa iheọma niile.
O were efereaja iheaja dị n'ime ya na ikonsọ bulite ha elu kwuo sị:
Site na Ya bụ Kristi
na n'isonye Ya
na kwa n'ime Ya
na n'ịdịko n'otu nke Mmụọ Nsọ
ka nsọpụrụ na otito niilesi adịrị Gị
Chukwu Nna ji ike niile
site n'ụwatụwa niile.
Ndi mmadụ anakwee: Amen
EMUME ORIRINSỌ
E dobechaa ikonsọ na efereaja, Ụkọchukwu e jikọọ aka ya ọnuọ sị:
Ebe e nyerela anyị iwu na-enye ndụ,
Anyị abụrụkwa ndị e ji nkụzi nke Chineke were zụọ,
ka anyị were nụ nkamobi kpee:
Ọ gbasaa aka ya, ya na ndị mmadụ ekpee:
Nna anyị nọ n'eluigwe
Ka otito dịrị Aha Gị,
Ka ọchịchị Gị bịa
Ka e mee uche Gị n'ụwa
Ka e sị eme ya n'eluigwe
Nye anyị tata nri nke ụbọchị anyị
Gbaghara anyị mmehie anyị ga
Dịka anyị sị gbaghara ndị mehiere anyị
Ekwela ka anyị kwenye na nlanye,
Ma zọpụta anyị n'ajọ ihe.
Ụkọchukwu gbasaa aka ya, o kwuo sị:
Zọpụta anyị, anyị na-arịọ
O Oseburụwa, n'ajọ ihe niile;
were ebere nye udo n'oge nke anyị.
Site n'inye aka ebere Gị,
ka a zọpụta anyị na njọ oge niile,
anyị ewere gbalahụ nsogbu niile,
were nchekwube dị nsọ na-atụ anya
maka mbịaghachị nke Onyenzọpụta anyị, Jesu Kristi.
O jikọọ aka yā.
Ndị mmadụ eweta ekpere na njedebe na kwee:
N'ihi na ọchịchị, ike na otito
bụ nke Gị, ebighịebi ebighịebi.
E mechaa, Ụkọchukwu agbasaa aka ya kwuwapụta ọfụma, sị:
Onyenweanyị Jesu Kristi,
Ị gwara ndị Apọstụl Gị:
udo ka m na-ahapụrụ ụnụ,
udo nke m ka m na-enye ụnụ:
E lekwala anya na njọ anyị ga,
kama n'okwukwe nke Nzukọ Gị;
nye Ya udo na ịdịkọ n'otu
ka uche Gị siri chọọ
O jikọọ aka ya
Gị bụ Onye dị ndụ na-achị
Ebighịebi ebighịebi.
Ndị mmadụ azaa: Amen.
Ụkọchukwu, echee ndị mmadụ ihu, gbasaa aka ya, jikọta ya wee gbakwunye sị:
Udo nke Oseburụwa dịịrị ụnụ mgbe niile
Ndị mmadụ azaa: Dịịrịkwa mmụọ Gị.
E mechaa, Ọ bụrụ na ọ dabara, Dikin maọbụ Ụkọchukwu agbakwunye:
Nyerịta nụ ibe ụnụ ekele nke udo!
Mmadụ niile, dị ka ndị sị eme, enyerịta ibe ha ekele nke udo orikọ na ịhụnanya; Ụkọchukwu enye Dikin maọbụ onye na-agba odibọ.
E mechaa o were achịcha nyawaa ya n'elu efereaja, tinye iberibe ya n'ime ikonsọ wetuo olu kwuo sị:
Ka njikọ Ahụ na Ọbara Onyenweanyị Jesu Kristi
wetaara anyị bụ ndị ga-anata Ya ndụ ebighịebi.
Mgbe nke a na-eme,a na-ekwe maọbụ na-ekwu:
Nwaatụrụ nke Chukwu Onye na-ekpochapụ njọ ga nke ụwa:
meere anyị ebere.
Nwaatụrụ nke Chukwu Onye na-ekpochapụ njọ ga nke ụwa:
meere anyị ebere.
Nwaatụrụ nke Chukwu Onye na-ekpochapụ njọ ga nke ụwa:
Nye anyị udo.
E nwere ike kwunwokwaa nke a imerime oge ma Ọ bụrụ na nnyawa achịcha were ogologo oge mana n'ikpeazụ a ga-ekwurịrị: Nye anyị udo.
E mechaa Ụkọchukwu ejikọọ aka ya, wetuo olu ya sị:
Dinwenụ Jesu Kristi,
Nwa nke Chukwu dị ndụ,
Onye si n'uche Nna,
na n'ọrụ nke Mmụọ Nsọ,
nye ụwa ndụ site n'ọnwụ Gị:
Zọpụta m, site n'Ahụ na Ọbara Gị nke a kacha nsọ,
na njọ niile na ajọ ihe niile.
Mee ka m kwụdosie ike n'iwu Gị mgbe niile
e kwekwala ka m kewapụ onwe m n'ebe Ị nọ.
Maọbụ:
Dinwenụ Jesu Kristi,
ka oriri Ahụ na Ọbara Gị,
ghara ịbụrụ m ikpe na amamikpe.
Ma site n'obiebere Gị,
ka Ọ bụụrụ m nchedo nke mmụọ na nke ahụ
na ihe na-eweta ọgwụgwọ.
Ụkọchukwu egbuo ikpere n'ala, were iheaja n'elu efereaja maọbụ n'elu ikonsọ, welite ya nwantịntị, che ndị mmadụ ihu, kwuwapụta, sị:
Lee Nwaatụrụ nke Chukwu
Lee Onye na-ekpochapụ njọ nke ụwa.
Ha dị ngọzị bụ ndị a kpọrọ
n'oriri nke Nwaatụrụ Chineke.
Ụkọchukwu ewetuo olu, ya na ndị mmadụ ekwuo otu ugboro sị:
Dinwenụ, etosighị m ka Ị bata n'ụlọ m
ma kwuo sọ okwu
a ga-agwọ mkpụrụobi m.
Ụkọchukwu echee ekwuaja ihu wetuo olu kwuo sị:
Ka Ahụ Kristi chekwaba m ruo na ndụ ebighịebi.
O were nsọpụrụ nata Ahụ Kristi. Nke a gachaa, o buru ikonsọ wetuo olu sị:
Ka Ọbara Kristi chekwaba m ruo na ndụ ebighịebi.
O were nsọpụrụ ñụọ Ọbara Kristi. Nke a gachaa o buru efereaja maọbụ ọkwa oriri nsọ gakwuru ndị ga-anata oriri welite oriri nsọ elu nwantịntị gosị onye ọbụla ọ ga-enye na-asị:
Ahụ Kristi.
Onye ga-anata oriri nsọ azaa: Amen.
Ọ natazịa oriri nsọ.
Otu ihe ahụ ka Dikin ga-eme ma ọ bụrụ na ọ na-eke oriri nsọ.
Ọ bụrụ na o nwere ndị ga-anata oriri nsọ n'ụdị naabọ, a ga-eso usoro dị ka ọ dị ebe a kọwapụtara ya.
Ka ụkọchukwu na-anata Ahụ Kristi, e bido ukwe oriri nsọ.
E kechaa oriri nsọ, Ụkọchukwu maọbụ Dikin maọbụ Akọlaịt ehichanye efereaja n'ime ikonsọ ma jichakwaa ikonsọ n’onwe ya. Mgbe ụkọchukwu na-eme nhicha, ọ ga- ewetu olu kpee:
Dinwenụ, ka anyị were obi ọcha
nabata ihe anyị jigoro ọnụ anyị wee rie
ka o sikwuazi n'onyinye na-agafe agafe
bụụrụ anyị ihe ọgwụgwọ ga-adị ebighịebi.
Ụkọchukwu nwere ike ịloghachi n'oche. Ohere dị, ndị mmadụ anọrọ jụụ maọbụ kwee abụọma maọbụ ukwe otito maọbụ ukwe ọzọ.
E mechaa,Ụkọchukwu akwụru n'ekwuaja maọbụ n'oche ya, chee ndị
mmadụ ihu jikọọ aka ya si:
Ka anyị rịọ arịrịọ
Mmadụ niile na Ụkọchukwu ekpee ekpere imeobi nwantịntị oge. Ma Ọ bụrụ na e meela nke a mbụ, ọ dịkwaghị mkpa. Nke a gachaa, Ụkọchukwu agbasaa aka ya kpee ekpere anatachaa oriri. Ndị mmadụ anakwee:
Amen.
EMUME MMECHI
Ugbu a, a ga-ama obere ọkwa ma Ọ bụrụ na e nwere ha.
Nke a gachaa,a ga-enwe mgbasa. Ụkọchukwu echee ndị mmadụ ihu, gbasaa aka
kwuo sị:
Onyenweanyị nọnyere ụnụ.
Ọha mmadụ azaghachị : Nọnyekwara mmụọ gị.
Ụkọchukwu agọzie ọha mmadụ kwuo sị:
Ka Chukwu ji ike niile gọzie ụnụ
Nna na Nwa na Mmụọ Nsọ.
Ọha mmadụ azaghachi: Amen.
N'ụbọchị maọbụ emume ụfọdụ tupu e nyee ngọzi a, a na-ebu ụzọ nwee usoro ngozi ozọ ka nwee ugwu maọbụ arịrịọ n'isi ọha mmadụ dị ka usoro emume siri hazie.
Na misa nnukwu Ụkọchukwu na-ekwu ọ ga-ekpuru okpu ukwu ya gbasaa aka sị:
Onyenweanyị nọnyere ụnụ.
Ọha mmadụ azaa: Nọnyekwara mmụọ gị.
Onyeisi emume ekwuo sị:
Ka ngọzi dịrị aha nke Osebụrụwa.
Oha mmadụ azaa: Site ugbu a ruo mgbe ebighịebi.
Onyeisi emume ekwuo sị:
Enyemaka anyị dị n'aha Onyenweanyị
Ọha mmadụ azaa : Onye mere eluigwe na ala.
Mgbe onye na-eme emume nara mkpọ (ma ọ bụrụ na eji ya), ọ sị,
Ka Chineke ji ike niile gọzie ụnụ,
Mgbe ọ na-emekwasa ndị mmadụ akara nke obe ugboro atọ,
Ọ ga-ekwu sị:
Nna na Nwa na Mmuo Nso.
Ọha mmadụ azaa: Amen.
E mechaa, Dikin maọbụ Ụkọchukwu n'onwe ya ejikọọ aka ya chee ndị mmadụ ihu sị:
Lawa nụ Misa agwụsigo.
Ọha mmadụ azaghachi : Ekele dịrị Chukwu.
Maọbụ:
Lawa nụ gaa kwusawa Oziọma nke Dinwenụ.
Maọbụ:
Lawa nụ n'udo, were nụ ndụ ụnụ tobe Dinwenụ.
Maọbụ:
Lawa nụ n'udo.
Ọha mmadụ azaghachi: Ekele dịrị Chukwu.
E mechaa, Ụkọchukwu ewere nsọpụrụ susuo ekwuaja ọnụ dịka dị ka ndị si eme, ka o si mee na mbido Misa.
N’ikpeazụ zi, Ụkọchukwu apụta n'ihu ckwuaja, ya na ndị na-agba odibọ ehulataruo isi
ala wee pụwazia.
Ọ bụrụ na e nwere emume ofifennu ọzọ na-esote ozigbo, a ga-ahapụ Emume Mgbasa.