NGOSIPỤTA ONWE NKE ONYENWEANYỊ
MMALITE EKPERE YUKARỊSTỊA
NGOSIPỤTA ONWE NKE ONYENWEANYỊ
KRISTI, ÌHÈ NKE MBA NIILE
A na-ekpe nke a na Misa nke ụbọchị Nnukwu Emume Ngosịpụta Onwe nke Onyenweanyị. Enwekwara ike ikpe ya maọbụ otu n'ime Mmalite Ekpere Yukarịstịa ọmụmụ nke Onyenweanyị ruo na Satọdee tupu Oriri Mmirichukwu nke Onyenweanyị.
V. Onyenweanyị nọnyere ụnụ.
R. Nọnyekwara mmụọ gị.
V. Welite nụ obi ụnụ elu.
R. Anyị ewelitela ha n'ebe Dinwenụ nọ.
V. Ka anyị nye nụ Dinwenụ Chukwu anyị ekele.
R. O kwesịrị, bụrụkwa ihe ziri ezi.
O kwesịrị ezie, bụrụkwa ihe ziri ezi, ọrụ dịịrị anyị,
na nzọpụta anyị,
na anyị ga-enye Gị ekele,oge niile,
na ebe niile, Dinwenụ, O Nna dị Nsọ,
Chineke ji ike niile, Onye dị ụwatụụwa.
N'ihi na taa, I gosịpụtara iheomimi nke nzọpụta anyị
n'ime Kristi dị ka ìhè nke mba niile.
Mgbe O gosịrị Onwe Ya
n'ọdịdị anyị nwere ike ịnwụ anwụ,
I jiri otito ọhụrụ nke anwụ anwụ Ya
mee anyị ka anyị dị ọhụrụ.
N'ihi nke a,
Anyị na-eso ndị Mmụọọma na Ndịisị Mmụọọma
Ha na Ukpoeze,
Ikeọchịchị na igwe ndịagha niile nke eluigwe,
na-ekwe ukwe otito Gị ebighịebi, na-asị:
Nsọ, Nsọ, Nsọ Oseburụwa Chineke nke igwe ndị agha...
Ọ bụrụ na a ga-ekpe Ekpere Yukarịstịa Nke Rom na Nnukwu Oriri Ngosịpụta Onwe nke Onyenweanyị, a ga ekpe ekpere mmekọrịta Anyị na ndị Nsọ pụrụ iche dị ka o siri dị n’ihuakwụkwọ…..