OGE OLILEANYA ỌBỊBỊA KRISTI II
MMALITE EKPERE YUKARỊSTỊA
OGE OLILEANYA ỌBỊBỊA KRISTI II
A na ekpe mmalite ekpere Yukarịstịa a na Misa ndị a na edo n’oge olileanya Obịbịa Kristi (Advent); bido n'ụbọchị ọnwa Disemba gbara 17 ruo na 24; a na-ekpekwa ya na Misa ndị ọzọ a na-edo n'oge a, ndị na-enweghị Mmalite Ekpere Yukarịstịa nke aka ha.
V. Onyenweanyị nọnyere ụnụ.
R. Nọnyekwara mmụọ gị.
V. Welite nụ obi ụnụ elu.
R. Anyị ewelitela ha n'ebe Dinwenụ nọ.
V. Ka anyị nye nụ Dinwenụ Chukwu anyị ekele.
R. O kweịrị, bụrụkwa ihe ziri ezi.
O kwesịrị ezie, bụrụkwa ihe ziri ezi, ọrụ dịịrị anyị,
na nzọpụta anyị,
na anyị ga-enye Gị ekele, oge niile,
na ebe niile, Dinwenụ, O Nna dị Nsọ,
Chineke ji ike niile, Onye di ụwatụụwa,
site na Kristi Dinwenụ anyi.
Onye ndị amụma niile kwupụtara obịbịa Ya,
Nne Ya bụ Vejin jiri ịhụnaanya na-enweghị atụ
buo afọime Ya.
Jọn mara amụma na ọ ga-abịa,
Gosịkwa Ya mgbe ọ bịara.
O nyere anyị ohere iji ọñụ
na-atụ anya iheomimi nke ọmụmụ Ya.
Ka o wee bụrụ na mgbe ọ bịara,
Ọ ga-ahụ na anyị nọ nnọọ na-eche nche n'ekpere
werekwa ukwe ọñụ na-egori n'otito Ya.
N'ihi nke a,
Anyị na ndị mmụọọma na ndịisi mmụọọma,
Ukpoeze na Ikeọchịchị nakwa igwe ndịagha
na Ike niile nke eluigwe,
na-ekwe ukwe otito Gị akwụsịghị akwụsị, na-asị :
Nsọ, Nsọ, Nsọ Oseburụwa Chineke nke igwe ndị agha..