N'OGE ỌPỊPỊA ỤBỌCHỊ IRI ANỌ ỤBỌCHỊ ONYENWEANYỊ
MMALITE EKPERE YUKARỊSTIA
ỤBỌCHỊ ONYENWEANYỊ
N'OGE ỌPỊPỊA ỤBỌCHỊ IRI ANỌ
ỌNWỤNWA A NWARA ONYENWEANYỊ
V. Onyenweanyị nọnyere ụnụ.
R. Nọnyekwara mmụọ gị.
V. Welite nụ obi ụnụ elu.
R. Anyị ewelitela ha n'ebe Dinwenụ nọ.
V. Ka anyị nye nụ Dinwenụ Chukwu anyị ekele.
R. O kwesịrị, bụrụkwa ihe ziri ezi.
O kwesịrị ezie, bụrụkwa ihe ziri ezi, ọrụ dịịrị anyị,
na nzọpụta anyị,
na anyị ga-enye Gị ekele, oge niile,
na ebe niile, Dinwenụ, O Nna dị Nsọ,
Chineke ji ike niile, Onye dị ụwatụụwa,
site na Kristi Dinwenụ anyị.
Onye, n'erighị nri ọbụla mkpụrụ ụbọchị iri anọ,
sitere n'ebumọnụ doo ụdị mmemme oge a nsọ,
bịa si n'ịkpọze ọnya onye iro ochie ahụ siri,
kuziere anyị ụzọ imeri ureghure nke njọ.
Ka ọ ga-abụ anyị were mmụọ ziri ezi,
na-eme mmemme iheomimi Ngafere,
n'isi njedebe,
anyị enwee ike ịbanyezi n'oriri Ngafere dị ebighịebi.
N'ihi nke a,
anyị na igwè ndị Mmụọọma na ndị Nsọ
na-ekwe ukwe otito Gị ebighịebi na-asị:
Nsọ, Nsọ, Nsọ Oseburụwa Chineke nke igwe ndị agha...