ỤBỌCHỊ ONYENWEANYỊ N'OGE ỌPỊPỊA ỤBỌCHỊ IRI ANỌ IV
MMALITE EKPERE YUKARỊSTỊA
ỤBỌCHỊ ONYENWEANYỊ
N'OGE ỌPỊPỊA ỤBỌCHỊ IRI ANỌ IV
NWOKE KPURU ISI PỤTA ỤWA
A na-ekpe nke a na Sọndee a gụrụ Ozịọma banyere nwoke kpuru isi pụta ụwa, ma ọbụghị nke a, e were Mmalite Ekpere Yukarịstịa nke oge Ọpịpịa Ụbọchị Irị Anọ I maọbụ II.
V. Onyenweanyị nọnyere ụnụ.
R. Nọnyekwara mmụọ gị.
V. Welite nụ obi ụnụ elu.
R. Anyị ewelitela ha n'ebe Dinwenụ nọ.
V. Ka anyi nye nụ Dinwenụ Chukwu anyị ekele.
R. O kwesịrị, bụrụkwa ihe ziri ezi.
O kwesịrị ezie, bụrụkwa ihe ziri ezi, ọrụ dịịrị anyị,
na nzọpụta anyị,
na anyị ga-enye Gị ekele, oge niile,
na ebe niile, Dinwenụ, O Nna dị Nsọ
Chineke ji ike niile, Onye dị ụwatụụwa,
site na Kristi Dinwenụ anyị.
Onye sirila n'iheomimi nke Mwereahụ
Kpọbata ụmụ mmadụ na-awagharị n'ọchịchịrị
n'ihé nke okwukwe;
bịakwa si na mwụcha nke mmụnwo,
nabata ndị a mụrụ n'ohu njọ diwara gboo,
mee ha ụmụ.
N'ihi nke a,
ka ihe niile dị n'igwe na n'ụwa na-esekpuru Gį,
ha na-ekwe ukwe ọhụrụ.
Anyị onwe anyị so igweagha niile nke ndi Mmụọọma
na-ekwupụta otito Gị oge niile na-asị :
Nsọ, Nsọ, Nsọ Oseburụwa Chineke nke igwe ndị agha...