OGE ỌPỊPỊA ỤBỌCHỊ IRI ANỌ III
MMALITE EKPERE YUKARỊSTỊA
OGE ỌPỊPỊA ỤBỌCHỊ IRI ANỌ III
URU DỊ NA MKPAGBU AGỤỤ NKE ANỤAHỤ
A na-ekpe nke a na Misa ụbọchi nkịtị n'oge ọpịpịa ụbọchị Iri Anọ na n'ụbọchị ebumọnụ.
V. Onyenweanyị nọnyere ụnụ.
R. Nọnyekwara mmụọ gị.
V. Welite nụ obi ụnụ elu.
R. Anyị ewelitela ha n'ebe Dinwenụ nọ.
V. Ka anyị nye nụ Dinwenụ Chukwu anyị ekele.
R. O kwesịrị, bụrụkwa ihe ziri ezi.
O kwesịrị ezie, bụrụkwa ihe ziri ezi, ọrụ dịịrị anyị,
na nzọpụta anyị,
na anyị ga-enye Gị ekele, oge niile,
na ebe niile, Dinwenụ, O Nna dị Nso,
Chineke ji ike niile, Onye dị ụwatụụwa.
Ọ bụ uche Gị,
na anyị ga-eji ịkpagbu agụụ nke anụahụ
na-enye Gị ekele;
ka ya bụ mkpagbu wee belata nganga
n'ime anyị bụ ndị njọ,
bịakwa site n'ịbawanye n'ime anyị,
inyere ndị nọ na mkpa aka,
o mee anyị ndị na-eñomi obiọma Gị.
N'ihi nke a,
Anyị na-eso igwe ndị Mmụọọma agụtaagụta,
were otu olu na-eto Gị na-asị :
Nsọ, Nsọ, Nsọ Oseburụwa Chineke nke igwe ndị agha……