OGE ỌPỊPỊA ỤBỌCHỊ IRI ANỌ II
MMALITE EKPERE YUKARỊSTỊA
OGE ỌPỊPỊA ỤBỌCHỊ IRI ANỌ II
NCHEGHARỊ IME MMỤỌ
A na-ekpe nke a n'oge Ọpịpịa Ụbọchị Iri Anọ, ma ọ kacha ụbọchị Sọndee mgbe a na-enweghị ike ikpe Mmalite Ekpere Yukarịstịa ọzọ.
V. Onyenweanyị nọnyere ụnụ.
R. Nọnyekwara mmụọ gị.
V. Welite nụ obi ụnụ elu.
R. Anyị ewelitela ha n'ebe Dinwenụ nọ.
V. Ka anyị nye nụ Dinwenụ Chukwu anyị ekele.
R. O kwesịrị,bụrụkwa ihe ziri ezi.
O kwesịrị ezie, bụrụkwa ihe ziri ezi, ọrụ dịịrị anyị,
na nzọpụta anyị,
na anyị ga-enye Gị ekele, oge niile,
na ebe niile, Dinwenụ, O Nna dị Nso,
Chineke ji ike niile, Onye dị ụwatụụwa.
I hiwere oge a pụrụ iche
maka ọdịmma nke ụmụ Gị,
Iji mezie ịdị ọcha nke ime mmụọ ha,
ka o wee bụrụ na
e wepụsịa oriwarawara agụụ ime njọ n'ime ha,
obi ha arapara n'ihe dị ebighịebi
karịa n'ịchụso ihe na-agafe agafe.
N'ihi nke a,
anyị na-eso ndị Nsọ na ndị Mmụọọma niile
na-eto Gị ebighịebi na-asị :
Nsọ, Nsọ, Nsọ Oseburụwa Chineke nke igwe ndi agha...