EKPERE YUKARỊSTỊA I
EKPERE YUKARỊSTỊA I
Ụkọchukwu ga-agbasa aka ya, sị:
Ya mere anyị ji si n'aka Jesu Kristi
Nwa Gị bụ Dinwenụ anyị
were umeala na-ekpe,na-arịọkwa Gị,
O Nna kacha ebere.
O jikọọ aka ya, sị:
Ka Ị nabata,
O mee akara nke obe n'elu achịchị na ikonsọ otu mgbe na-asị:
Ma gọzie * onyinye ndị a, ihenhunye ndị a,
na aja ndị a dị nsọ na-enweghị ntụpọ.
Ụkọchukwu ga-agbasa aka, gụrụ na-aga:
Na mbụ, anyị na-ehunyere Gị ha,
maka Nzukọ Gị dị nsọ bụ Katọliki;
biko ka Ọ masị Gị inye ya udo,
Ichekwaba ya, ijikọta ya na ịchị ya,
gazuo ụwa niile:
ya na nwaodibo Gị bụ Nna anyị Poopu...
na Bishọpụ anyị bụ (*).....
na kwa ndị na-echekwa ezi okwukwe nke Nzukọ Katọliki
nke si n'aka Ndịapọstụl bịa
Ncheta ndị dị ndụ.
Cheta ụmụodibo gị ndị nwoke na ndị nwaanyị
(Aha)... O Osebụrụwa,
O jikọọ aka ya kpeere ndị o bụ n'uche ekpere nwantịntị oge.
Ọ ga agbasakwa aka ya, kperekwa gawa na-asị:
Chetakwa ndị niile gbara ebe a okirikiri
Ndị Ị maara okwukwe na mmụọ ofufe ha.
Ọ bụ n'ihi ha ka anyị na-achụnyere Gị aja otito nke a,
Maọbụ, ha onwe ha na-achụnyere Gị ya
maka onwe ha na ndị niile dị ha n'obi :
maka mgbapụta nke mkpụrụobi,
olileanya nzọpụta na ọdịmma nke ahụ ha.
Ha na ehunyere Gị ekpere ha,
Chineke dị ọkpụ, onye dị ndụ bụrụkwa ezie.
Lekwaa anya n'okpuru!
Na mmekọrịta anyị, na ndị anyị ji nsọpụrụ na-echeta:
na mbụ, Marịa Vejin ọkpụ dị otito,
Nne nke Chukwu na Dinwenụ anyị, Jesu Kristi,
+ Nakwa Josef dị ngọzi bụ dị ya,
Ndịapọstụl Gị dị ngọzi,
na ndị nke Gị e gburu egbu maka okwukwe:
Pita na Pọl, Andru,
(Jemis, Jọn, Tọmọs, Jemis, Filip,
Batolomi, Matiu, Saịmọn, na Tadeus,
Laịnus, Kletus, Klementi, Sistus,
Kọnelus, Sipren, Lọrensị, Krisọgọnus,
Jọn na Pọl, Kọsmas na Demiọn)
na ndị nsọ Gị niile:
Mee ka anyị si n'ụgwọ dịịrị ezi omume na arịrịo ha
nweta nchedo n'ihe niile site n'enyemaka nchekwa Gị
(Site na Kristi Dinwenụ anyị. Amen.)
MMEKỌRỊTA NKE IZUGBE NZUKỌ N'ỤBỌCHỊ EMUME DỊ ICHEICHE
Maka Ụbọchị ọmụmụ Dinwenụ anyị na abalị asatọ so ya.
Na mmekọrịta anyị,
na kwa ka anyị na-eme mmemme (nke abalị kachasị nsọ),
nke ụbọchị a kachasị nsọ :
Mgbe ọnọdụ abụmvejin na-enweghị atụtụ nke Marịa
Wepụtaara ụwa a Onyenzọpụta,
Anyị jikwuazi nsọpụrụ na-echeta:
na mbụ, Marịa Vejin ọkpụ dị otito,
Nne nke Chukwu na Dinwenụ anyị, Jesu Kristị. Ⴕ
Ụbọchị Ngosịpụta Onwe Nke Onyenweanyị.
Na mmekọrịta anyị,
Na kwa ka anyị na-eme mmemme nke ụbọchi a kachasị nsọ,
Mgbe Nwa Gị a mụrụ naanị Ya,
Onye Gị na Ya dị ebighịebi n'otito Gị
Pụtara ihe n'ụdị a na-ahụ anya, n'ezi ahụ mmadụ.
Anyị jikwuazi nsọpụrụ na-echeta:
na mbụ, Marịa Vejin ọkpụ dị otito,
Nne nke Chukwu na Dinwenụ anyị, Jesu Kristi. Ⴕ
Bido na Misa Ncheabalị Nke Mbilitenọnwụ ruo na Sọndee nke abụọ nke Oge Mbilitenọnwụ.
Na mmekọrịta anyị,
na kwa ka anyị na-eme mmemme (nke abalị kachasị nsọ),
nke ụbọchị kachasị nsọ:
Nke mbilitenọnwụ Dinwenụ anyị Jesu Kristi n'ụdị ahụ,
Anyị jikwuazi nsọpụrụ na-echeta:
Na Mbụ, Marịa Vejin ọkpụ dị otito,
Nne nke Chukwu na Dinwenụ anyị, Jesu Kristi. Ⴕ
Maka Nrogo n'eluigwe Nke Dinwenụ
Na mmekọrịta anyị,
na kwa ka anyị na-eme mmemme nke ụbọchi kachasị nsọ:
Mgbe Dinwenụ anyị, Otu Nwa Gị a mụrụ naanị Ya
bulitere ụdị anyị na-adịghị ike
nke e jikọtara n'ime Onwe Ya,
n'aka nri nke otito Gị,
Anyị jikwuazi nsọpụrụ na-echeta:
na mbụ, Marịa Vejin ọkpụ dị otito,
Nne nke Chukwu na Dinwenụ anyị, Jesu Kristi. Ⴕ
Maka ụbọchị Pentikostụ.
Na mmekọrịta anyị,
na kwa ka anyị na-eme mmemme
nke ụbọchị Pentikọstụ kachasị nsọ:
mgbe Mmụọ Nsọ pụtara ihe n'ụdị ireọkụ n'ebe Ndị Apọstụl nọ:
Anyị jikwuazi nsọpụrụ na-echeta:
na mbụ, Marịa Vejin ọkpụ dị otito,
Nne nke Chukwu na Dinwenụ anyị, Jesu Kristi. Ⴕ
Ọ ga-agbasa aka ya, kpere na-aga :
Ya bụ, Dinwenụ, anyị na-arịọ
ka ọ masị Gị ịnara aja ofufe anyị
ya na nke ezinaụlo Gị niile.
Hazie ụbọchị anyị niile n'udo Gị.
nye iwu ka a zọpụta anyị na ndafu ebighịebi
ka a gụnyekwa anyị n'igwe atụrụ Ị họọrọ,
Ọ jikọọ aka ya
(Site na Kristi Dinwenụ anyị. Amen.)
Na Misa oriri ikpeazụ nke Dinwenụ.
Ya bụ, Dinwenụ, anyị na-arịọ
ka ọ masị Gị ịnara aja ofufe anyị,
ya na nke ezinaụlọ Gị niile.
Nke anyị na-achụnyere Gị maka ụbọchị ahụ
Dinwenụ anyị Jesu Kristi nyefere ndị ụmụazụ Ya
iheomimi nke Ahụ na Ọbara Ya
ka ha na-eme mmemme Ya
hazie Ụbọchị anyị niile n'udo Gị.
Nye iwu ka a zọpụta anyị na ndafu ebighịebi
ka a gụnyekwa anyị n'igwe atụrụ Ị họọrọ,
Ọ jikọọ aka ya
(Site na Kristi Dinwenụ anyị .Amen.)
Site na Misa nche abalị Mbilitenọnwụ ruo na Sọnde nke abụọ nke
Mbilitenọnwụ.
Ya bụ, Dinwenụ, anyị na-arịọ
ka Ọ masị Gị ịnara aja ofufe anyị,
ya na nke ezinaụlọ Gị niile.
Nke anyị na-achụnyere Gị
maka ndị a kwa Ọ masịrị Gị ịmụgharị ọzọ
site na mmiri na Mmụọnsọ;
ka Ị na-enye ha mgbaghara nke njọ niile,
hazie ụbọchị anyị niile n'udo Gị.
Nye iwu ka a zọpụta anyị na ndafu ebighịebi
ka a gụnyekwa anyị n'igwe atụrụ Ị họọrọ,
Ọ jikọọ aka ya
(Site na Kristi Dinwenụ anyị. Amen.)
Ọ ga-esetịpụ aka ya abụọ n'elu iheaja, na-ekwu sị:
Anyị na-arịọ Gị O Chukwu
ka ọ masị Gị ime ka aja nke a
bụrụ ihe a gọziri agọzi,
ihe a nabatara, ihe bụ ezie,
si na mmụọ, kwesịkwa na a ga-anara, n'ụzọ niile,
ka o wee bụụrụ anyị
Ahụ na Ọ bara Nwa Gị Ị hụrụ n'anya nke ukwuu,
Dinwenụ anyị Jesu Kristi.
O jikọọ aka ya
N'okwu ndị na-esonụ. a ga-ekwupụta mkpụrụokwu nke Dinwenụ n'ụzọ chawapụrụ achawapụ, doro anya, dịka ụdị okwu ndị ahụ kwesịrị
Onye bịara n'ụbọchị bọrọ ụbọchị Ọ tara ahụhụọnwụ,
Na Misa oriri ikpeazụ nke Dinwenụ.
Onye bịara n'ụbọchị bọrọ ụbọchị Ọ tara ahụhụọnwụ
maka nzọpụta anyị na nke mmadụ niile, ya bụ taata
O were achịcha,welite ya elu nwantịntị n'elu ekwuaja, kwuru gawa:
Weere achịcha n'aka Ya dị nsọ dịkwa ebube,
O welite anya
welite anya n'eluigwe
chee Gị bụ Chineke Nna Ya ji ike niile ihu,
ka Ọ na-enye Gị ekele, Ọ gozie,
nyawaa, nyekwa ya ndị ụmụazụ Ya, na-asị :
O hulata nwantịntị
NARA NU NKE A, RIE NỤ YA ỤNỤ NIILE:
NKE A BỤ AHỤ M,
NKE A GA-EDURU NYE MAKA ỤNỤ.
O ga-egosị ndị mmadụ achịcha e doro nsọ, weghachikwa ya n'efereaja
gbuokwa ikpere sekpuo.
Mgbe o mechara nke a, o kwuru na-aga:
Otu a kwa ka O siri mee, mgbe e richara nri anyasị
Ọ ga-eburu ikonsọ, welite ya elu nwantịntị n'elu ekwuaja kwuru na-aga:
O buuru ikonsọ a tosịrị nsọpụrụ
n'aka Ya dị nsọ dịkwa ebube
ka Ọ na-enyekwa Gị ekele, Ọ gozie ya,
bunyekwa ya ụmụazu Ya, na-asị:
O hulata nwantịntị
NARA NỤ NKE A, ÑỤỌ NỤ YA, ỤNỤ NIILE:
NKE A BỤ IKONSỌ NKE ỌBARA M,
NKE ỌGBỤGBANDỤ ỌHỤRỤ DỊ EBIGHỊEBI,
A GA-AGBA YA N'IHI ỤNỤ,
NA N'IHI IMERIME MMADỤ
KA E WERE GBAGHARA NJỌ GA,
NA-EME NỤ NKE A NA NCHETA NKE M.
O gosị ndị mmadụ ikonsọ dowe ya n'elu akwandosa Ahụ Kristị
gbuokwa ikpere, sekpuo.
O ga-ekwuzi sị:
Iheomimi nke okwukwe
Ndi mmadu agaa n'ihu na-ekwuwapụta:
Anyị na-ekwusa ọnwụ Gị
na-ekwupụtakwa mbilitenọnwụ Gị,
O Dinwenụ, wee ruo mgbe Ị ga-abịa.
Maobu:
Oge ọbụla anyị na-eri achịcha nke a,
na-añụ ikonsọ nke a,
anyị na-ekwusa ọnwụ Gị,
O Dinwenụ, Wee ruo mgbe Ị ga-abịa.
Maobu:
Onyenzọpụta nke ụwa, biko zọpụta anyị:
Gị bụ Onye sitere n'obe na
na mbilitenọnwụ Gị tọhapụ anyị.
Nke a gachaa, ụkọchukwu agbasaa aka ya sị:
N'ihi nke a, O Dinwenụ,
ebe anyị bụ ụmụodibọ Gị,
na ndị nke Gị dị nsọ
na-echeta ahụhụ na ọnwụ dị ngọzi
nke Kristi Nwa Gị bụ Dinwenụ anyị,
na mbilitenọnwụ Ya site na ndị nwụrụ anwụ,
na kwa nrogoro n'eluigwe Ya dị otito,
anyị na-esite n'onyinye Gị I nyegara anyị
na-ehunyere ebubeeze Gị dị ugwu,
aja nke a dị sam, aja dị nsọ, aja na-enweghị ntụpọ
achịcha dị nsọ, nke ndụ ọkpụ
na ikonsọ nzọpụta ebighịebi.
Biko were ihu ọma na obi ebere lekwasị ha anya,
narakwa ha dịka o si masị Gị ịnara
onyinye nke nwaodibị Gị bụ Ebel, onye ezi omume
na aja nke nna anyị Ebraham,
na kwa aja dị nsọ, aja na-enweghị atụtụ
nke Melkizedek, nnukwu ụkọchukwu Gị chụnyeere Gị.
O hulata, jikọọ aka ya kwuru na-aga:
Anyị ji obi umeala na-arịọ Gị,
O Chukwu pụrụ ime ihe niile,
nye iwu ka Mmụọọma Gị dị nsọ were aka ya
buru ihe ndị a rute n'ekwuaja Gị dị elu,
n'ihu ebubeeze Gị bụ Chukwu,
ka anyị niile
sitere n'isonye na mmemme ekwuaja nke a
nata Ahụ na Ọbara kasị nsọ nke Nwa Gị,
O kulie dụọ akara nke obe na-asị:
Jupụta na ngọzi niile nke eluigwe na n'amara
O jikọọ aka ya
(Site na Kristi Dinwenu anyi. Amen.)
Ncheta ndị nwụrụ anwụ
Ọ gbasaa aka ya sị:
Chetakwuazi, O Osebụrụwa,
ụmụodibọ Gị ndị nwoke na ndị nwaanyị (Aha)...
ndị ji akara nke okwukwe,
buru anyị ụzọ na-arahụ ụra nke udo.
O jikoo aka ya kpee ekpere nwantinti oge maka ndị nwụrụ anwụ o bụ n'uche.
Nke a gachaa, Ọ gbasakwaa aka ya kperekwa na-aga:
Biko Dinwenụ, anyị na-arịọ ka I nye
ha na ndị niile na-ezuru ike na Kristi,
ọnọdụ ezumike, ihe na udo
O jikoo aka ya
(Site na Kristi Dinwenụ anyị. Amen.)
O were aka nri suo n'obi ya sị:
Biko, nyekwuazi anyị onwe anyị bụ ụmụodibọ Gi, Ndị njọ,
Ọ gbasakwa aka ya kperekwa na-aga
Ndị chekwubere n'ụbara ebere Gị,
oke na ọnọdụ n'etiti ndị Apọstụl Gị dị nsọ
na ndị e gburu maka okwukwe:
Jon, Stivin, Matayas, Banabas
(Igneshọs, Elezanda, Masilinus, Pita, Felisitas,
Pepechụa, Agata, Lusi, Agnes, Sisilia, Anastesia)
na Ndịnsọ Gi niile.
Anyị na arịọ, ejela nyochawa ka ihe ọma anyị metera ha,
ma were ihi ebere na obịọma gụnye anyị n'otu ha.
O jikọọ aka ya Sị:
Site na Kristi Dinwenụ anyị.
O kperekwa gawa :
Onye Ị na-esite na ya mgbe niile, O Osebụrụwa
eke iheọma niile ndị a, edo ha nsọ,
enye ha ndụ, na-agọzi ha na-enyekwa anyị ha.
O were efereaja iheaja dị n'ime ya na ikonsọ bulite ha elu kwuo sị:
Site na Ya bụ Kristi
na n'isonye Ya
na kwa n'ime Ya
na n'ịdịkọ n'otu nke Mmụọ Nsọ
ka nsọpụrụ na otito niile si adịrị Gị
Chukwu Nna ji ike niile
site n'ụwatụwa niile.
Ndị mmadụ anakwee: Amen!
EMUME ORIRINSỌ
E dobechaa ikonsọ na efereaja, Ụkọchukwu e jikọọ aka ya ọnuọ sị:
Ebe e nyerela anyị iwu na-enye ndụ,
Anyị abụrụkwa ndị e ji nkụzi nke Chineke were zụọ,
ka anyị were nụ nkamobi kpee:
Ọ gbasaa aka ya, ya na ndị mmadụ ekpee:
Nna anyị nọ n'eluigwe
Ka otito dịrị Aha Gị,
Ka ọchịchị Gị bịa
Ka e mee uche Gị n'ụwa
Ka e sị eme ya n'eluigwe
Nye anyị tata nri nke ụbọchị anyị
Gbaghara anyị mmehie anyị ga
Dịka anyị sị gbaghara ndị mehiere anyị
Ekwela ka anyị kwenye na nlanye,
Ma zọpụta anyị n'ajọ ihe.
Ụkọchukwu gbasaa aka ya, o kwuo sị:
Zọpụta anyị, anyị na-arịọ
O Oseburụwa, n'ajọ ihe niile;
were ebere nye udo n'oge nke anyị.
Site n'inye aka ebere Gị,
ka a zọpụta anyị na njọ oge niile,
anyị ewere gbalahụ nsogbu niile,
were nchekwube dị nsọ na-atụ anya
maka mbịaghachị nke Onyenzọpụta anyị, Jesu Kristi.
O jikọọ aka yā.
Ndị mmadụ eweta ekpere na njedebe na kwee:
N'ihi na ọchịchị, ike na otito
bụ nke Gị, ebighịebi ebighịebi.
E mechaa, Ụkọchukwu agbasaa aka ya kwuwapụta ọfụma, sị:
Onyenweanyị Jesu Kristi,
Ị gwara ndị Apọstụl Gị:
udo ka m na-ahapụrụ ụnụ,
udo nke m ka m na-enye ụnụ:
E lekwala anya na njọ anyị ga,
kama n'okwukwe nke Nzukọ Gị;
nye Ya udo na ịdịkọ n'otu
ka uche Gị siri chọọ
O jikọọ aka ya
Gị bụ Onye dị ndụ na-achị
Ebighịebi ebighịebi.
Ndị mmadụ azaa: Amen.
Ụkọchukwu, echee ndị mmadụ ihu, gbasaa aka ya, jikọta ya wee gbakwunye sị:
Udo nke Oseburụwa dịịrị ụnụ mgbe niile
Ndị mmadụ azaa: Dịịrịkwa mmụọ Gị.
E mechaa, Ọ bụrụ na ọ dabara, Dikin maọbụ Ụkọchukwu agbakwunye:
Nyerịta nụ ibe ụnụ ekele nke udo!
Mmadụ niile, dị ka ndị sị eme, enyerịta ibe ha ekele nke udo orikọ na ịhụnanya; Ụkọchukwu enye Dikin maọbụ onye na-agba odibọ.
E mechaa o were achịcha nyawaa ya n'elu efereaja, tinye iberibe ya n'ime ikonsọ wetuo olu kwuo sị:
Ka njikọ Ahụ na Ọbara Onyenweanyị Jesu Kristi
wetaara anyị bụ ndị ga-anata Ya ndụ ebighịebi.
Mgbe nke a na-eme,a na-ekwe maọbụ na-ekwu:
Nwaatụrụ nke Chukwu Onye na-ekpochapụ njọ ga nke ụwa:
meere anyị ebere.
Nwaatụrụ nke Chukwu Onye na-ekpochapụ njọ ga nke ụwa:
meere anyị ebere.
Nwaatụrụ nke Chukwu Onye na-ekpochapụ njọ ga nke ụwa:
Nye anyị udo.
E nwere ike kwunwokwaa nke a imerime oge ma Ọ bụrụ na nnyawa achịcha were ogologo oge mana n'ikpeazụ a ga-ekwurịrị: Nye anyị udo.
E mechaa Ụkọchukwu ejikọọ aka ya, wetuo olu ya sị:
Dinwenụ Jesu Kristi,
Nwa nke Chukwu dị ndụ,
Onye si n'uche Nna,
na n'ọrụ nke Mmụọ Nsọ,
nye ụwa ndụ site n'ọnwụ Gị:
Zọpụta m, site n'Ahụ na Ọbara Gị nke a kacha nsọ,
na njọ niile na ajọ ihe niile.
Mee ka m kwụdosie ike n'iwu Gị mgbe niile
e kwekwala ka m kewapụ onwe m n'ebe Ị nọ.
Maọbụ:
Dinwenụ Jesu Kristi,
ka oriri Ahụ na Ọbara Gị,
ghara ịbụrụ m ikpe na amamikpe.
Ma site n'obiebere Gị,
ka Ọ bụụrụ m nchedo nke mmụọ na nke ahụ
na ihe na-eweta ọgwụgwọ.
Ụkọchukwu egbuo ikpere n'ala, were iheaja n'elu efereaja maọbụ n'elu ikonsọ, welite ya nwantịntị, che ndị mmadụ ihu, kwuwapụta, sị:
Lee Nwaatụrụ nke Chukwu
Lee Onye na-ekpochapụ njọ nke ụwa.
Ha dị ngọzị bụ ndị a kpọrọ
n'oriri nke Nwaatụrụ Chineke.
Ụkọchukwu ewetuo olu, ya na ndị mmadụ ekwuo otu ugboro sị:
Dinwenụ, etosighị m ka Ị bata n'ụlọ m
ma kwuo sọ okwu
a ga-agwọ mkpụrụobi m.
Ụkọchukwu echee ekwuaja ihu wetuo olu kwuo sị:
Ka Ahụ Kristi chekwaba m ruo na ndụ ebighịebi.
O were nsọpụrụ nata Ahụ Kristi. Nke a gachaa, o buru ikonsọ wetuo olu sị:
Ka Ọbara Kristi chekwaba m ruo na ndụ ebighịebi.
O were nsọpụrụ ñụọ Ọbara Kristi. Nke a gachaa o buru efereaja maọbụ ọkwa oriri nsọ gakwuru ndị ga-anata oriri welite oriri nsọ elu nwantịntị gosị onye ọbụla ọ ga-enye na-asị:
Ahụ Kristi.
Onye ga-anata oriri nsọ azaa: Amen.
Ọ natazịa oriri nsọ.
Otu ihe ahụ ka Dikin ga-eme ma ọ bụrụ na ọ na-eke oriri nsọ.
Ọ bụrụ na o nwere ndị ga-anata oriri nsọ n'ụdị naabọ, a ga-eso usoro dị ka ọ dị ebe a kọwapụtara ya.
Ka ụkọchukwu na-anata Ahụ Kristi, e bido ukwe oriri nsọ.
E kechaa oriri nsọ, Ụkọchukwu maọbụ Dikin maọbụ Akọlaịt ehichanye efereaja n'ime ikonsọ ma jichakwaa ikonsọ n’onwe ya. Mgbe ụkọchukwu na-eme nhicha, ọ ga- ewetu olu kpee:
Dinwenụ, ka anyị were obi ọcha
nabata ihe anyị jigoro ọnụ anyị wee rie
ka o sikwuazi n'onyinye na-agafe agafe
bụụrụ anyị ihe ọgwụgwọ ga-adị ebighịebi.
Ụkọchukwu nwere ike ịloghachi n'oche. Ohere dị, ndị mmadụ anọrọ jụụ maọbụ kwee abụọma maọbụ ukwe otito maọbụ ukwe ọzọ.
E mechaa,Ụkọchukwu akwụru n'ekwuaja maọbụ n'oche ya, chee ndị
mmadụ ihu jikọọ aka ya si:
Ka anyị rịọ arịrịọ
Mmadụ niile na Ụkọchukwu ekpee ekpere imeobi nwantịntị oge. Ma Ọ bụrụ na e meela nke a mbụ, ọ dịkwaghị mkpa. Nke a gachaa, Ụkọchukwu agbasaa aka ya kpee ekpere anatachaa oriri. Ndị mmadụ anakwee:
Amen.
EMUME MMECHI
Ugbu a, a ga-ama obere ọkwa ma Ọ bụrụ na e nwere ha.
Nke a gachaa,a ga-enwe mgbasa. Ụkọchukwu echee ndị mmadụ ihu, gbasaa aka
kwuo sị:
Onyenweanyị nọnyere ụnụ.
Ọha mmadụ azaghachị : Nọnyekwara mmụọ gị.
Ụkọchukwu agọzie ọha mmadụ kwuo sị:
Ka Chukwu ji ike niile gọzie ụnụ
Nna na Nwa na Mmụọ Nsọ.
Ọha mmadụ azaghachi: Amen.
N'ụbọchị maọbụ emume ụfọdụ tupu e nyee ngọzi a, a na-ebu ụzọ nwee usoro ngozi ozọ ka nwee ugwu maọbụ arịrịọ n'isi ọha mmadụ dị ka usoro emume siri hazie.
Na misa nnukwu Ụkọchukwu na-ekwu ọ ga-ekpuru okpu ukwu ya gbasaa aka sị:
Onyenweanyị nọnyere ụnụ.
Ọha mmadụ azaa: Nọnyekwara mmụọ gị.
Onyeisi emume ekwuo sị:
Ka ngọzi dịrị aha nke Osebụrụwa.
Oha mmadụ azaa: Site ugbu a ruo mgbe ebighịebi.
Onyeisi emume ekwuo sị:
Enyemaka anyị dị n'aha Onyenweanyị
Ọha mmadụ azaa : Onye mere eluigwe na ala.
Mgbe onye na-eme emume nara mkpọ (ma ọ bụrụ na eji ya), ọ sị,
Ka Chineke ji ike niile gọzie ụnụ,
Mgbe ọ na-emekwasa ndị mmadụ akara nke obe ugboro atọ,
Ọ ga-ekwu sị:
Nna na Nwa na Mmuo Nso.
Ọha mmadụ azaa: Amen.
E mechaa, Dikin maọbụ Ụkọchukwu n'onwe ya ejikọọ aka ya chee ndị mmadụ ihu sị:
Lawa nụ Misa agwụsigo.
Ọha mmadụ azaghachi : Ekele dịrị Chukwu.
Maọbụ:
Lawa nụ gaa kwusawa Oziọma nke Dinwenụ.
Maọbụ:
Lawa nụ n'udo, were nụ ndụ ụnụ tobe Dinwenụ.
Maọbụ:
Lawa nụ n'udo.
Ọha mmadụ azaghachi: Ekele dịrị Chukwu.
E mechaa, Ụkọchukwu ewere nsọpụrụ susuo ekwuaja ọnụ dịka dị ka ndị si eme, ka o si mee na mbido Misa.
N’ikpeazụ zi, Ụkọchukwu apụta n'ihu ckwuaja, ya na ndị na-agba odibọ ehulataruo isi
ala wee pụwazia.
Ọ bụrụ na e nwere emume ofifennu ọzọ na-esote ozigbo, a ga-ahapụ Emume Mgbasa.