OGE OLILEANYA ỌBỊBỊA KRISTI I
OGE OLILEANYA ỌBỊBỊA KRISTI I
A na-ekpe Mmalite Ekpere Yukarịstịa a na Misa ndị a na-edo n'oge Olileanya Obịbịa Kristi; bido na Sọndee Nke Mbụ ruo ụbọchị ọnwa Dịsemba gbara 16; a na-ekpekwa ya na Misa ndị ọzọ a na-edo n'oge a, ndị na-enweghị Mmalite Ekpere Yukarịstịa nke aka ha.
V. Onyenweanyị nọnyere ụnụ.
R. Nọnyekwara mmụọ gi.
V. Welite nụ obi ụnụ elu.
R. Anyị ewelitela ha n'ebe Dinwenụ nọ.
V. Ka anyi nye nụ Dinwenụ Chukwu anyị ekele.
R. O kwesiri, bụrụkwa ihe ziri ezi.
O kwesịrị ezie, bụrụkwa ihe ziri ezi, ọrụ diiri anyi,
na nzọpụta anyị,
na anyị ga-enye Gị ekele, oge niile,
na ebe niile, Dinwenụ, O Nna dị Nsọ,
Chineke ji ike niile, Onye di ụwatụụwa,
Site na Kristi Dinwenụ anyị .
Onye,n'ọbịbịa mbụ Ya, n'umeala nke mwereahụ,
Mejupụtara atụmatụ I zubere mgbe ochie,
Bịakwa megheere anyị ụzọ nzọpụta ebighịebi ;
ka ọ ga-abụ, n'obịbịa Ya nke abụọ,
na nnukwu otito nke ebube Ya,
anyị ga-ahụ, mata n'ikpeazụ, n'ụzọ doro anya,
mmejupụta atụmatụ ahụ anyị ji maka ya
kara obi na-eche nche ugbua,
nọgidesie ike n'olileanya anyị.
N'ihi nke a,
Anyị na ndị Mmụọọma na Ndịisi Mmụọọma,
Ukpoeze na Ikeọchịchị nakwa igwe ndịagha
na Ike niile nke eluigwe,
na-ekwe ukwe otito Gị akwụsịghi akwụsị, na-asị :
Nsọ, Nsọ, Nsọ Oseburụwa Chineke nke igwe ndị agha...