OGE ỌPỊPỊA ỤBỌCHỊ IRI ANỌ IV
MMALITE EKPERE YUKARỊSTỊA
OGE ỌPỊPỊA ỤBỌCHỊ IRI ANỌ IV
URU DỊ N'EBUMỌNỤ
A na-ekpe nke a na Misa ụbọchị nkịtị n'oge ọpịpịa Ųbọchị Iri Anọ na n'ụbọchị ebumọnụ.
V. Onyenweanyị nọnyere ụnụ.
R. Nọnyekwara mmụọ gị.
V. Welite nụ obi ụnụ elu.
R. Anyị ewelitela ha n'ebe Dinwenụ nọ.
V. Ka anyị nye nụ Dinwenụ Chukwu anyị ekele.
R. O kwesịrị, bụrụkwa ihe ziri ezi.
O kwesịrị ezie, bụrụkwa ihe ziri ezi, ọrụ dịịrị anyị,
na nzọpụta anyị,
na anyị ga enye gị ekele, oge niile,
na ebe niile, Dinwenụ, O nna dị Nsọ,
Chineke ji ike niile,Onye dị ụwatụụwa.
N'ihi na site n'ebumọnụ nke anụahụ
Ị na-akpagbu mmarahụ njọ,
na-ewelite mmụọ anyị elu,
na-enye anyị mmarahụ eziomume na ụgwọ dịịrị ya,
site na Kristi Dinwenụ anyị.
Onye igwe ndị Mmụọọma si na ya na-eto ebubeeze Gị,
Ike niile na atụrụ gị egwu, Ukpoeze na esekpuru gị,
Ỉgwẽ na Ike niile nke eluigwe, na serafim dị ngọzị,
Ji otu olu ma ukwe ọῆụ
Na ekwupụta otito Gị.
Anyị na-arịọ ka I kwe ka anyị tinyekọọ olu anyị na nke ha, were umeala na-eto Gị na-asị :
Nsọ, Nsọ, Nsọ Oseburụwa Chineke nke igwe ndị agha...