IZUGBE I
MMALITE EKPERE YUKARỊSTỊA
IZUGBE I
MWEGHACHI ỌNỌDỤ IHE NHE N'IME KRISTI
A na-ekpe nke a na Misa ndị ọ na-enweghị Mmalite Ekpere Yukarịstịa nke aka ha. E
nwekwara ike ikpe ya na Misa ndị Ọ na-abụghị iwu na a ga-ekperịrị Mmalite Ekpere
Yukarịstịa nke oge emume.
V. Onyenweanyị nọnyere ụnụ.
R. Nọnyekwara mmụọ gị.
V. Welite nụ obi ụnụ elu.
R. Anyị ewelitela ha n'ebe Dinwenụ nọ.
V. Ka anyị nye nụ Dinwenụ Chukwu anyị ekele.
R. O kwesịrị, bụrụkwa ihe ziri ezi.
O kwesịrị ezie, bụrụkwa ihe ziri ezi, ọrụ dịịrị anyị,
na nzọpụta anyị,
Na anyị ga-enye Gị ekele, oge niile,
Na ebe niile, Dinwenụ, O Nna dị Nsọ,
Chineke ji ike niile, Onye dị ụwatụụwa,
Site na Kristi Dinwenụ anyị.
Onye ọ masịrị Gị imegharị ihe niile
ka ha dị ọhụrụ n'ime Ya,
Bịakwa mee ka mmadụ niile keta oke n'ụba Ya.
Ọ bụ ezie na Ọ dị n'ụdị Chukwu,
Ma Ọ napụrụ Onwe Ya ebube Ya,
Wee wetara ụwa udo site n'ọbara Ọ gbara n'elu obe.
Nke a mere e ji welite Ya elu
Karịa ihe dum e kere eke,
O wee bụrụ ụzọ nzọpụta ebighịebi
Maka ndị niile na-eso Ya.
N'ihi nke a,
Anyị na-eso ndị Mmụọọma na ndị Isimmụọọma,
Ukpoeze na Ikeọchịchị,
Ha na kwa usuu igwe ndị agha niile nke eluigwe,
Na-ekwe ukwe otito Gị ebighịebi na-asị:
Nsọ, Nsọ, Nsọ Oseburụwa Chineke nke igwe ndị agha...