YUKARỊSTỊA KACHASỊ NSỌ I
MMALITE EKPERE YUKARỊSTỊA
YUKARỊSTỊA KACHASỊ NSỌ I
AJA NA ÀMÀNSỌ NKE KRISTI
A na-ekpe nke a na Misa nke Oriri Ikpeazụ nke Dinwenụ. E nwekwara ike ikpe ya na Nnukwu Oriri nke Ahụ na Ọbara Kristi Kachasị Nsọ, na kwa Misa Onyechọọ Nke Yukarịstịa kachasị Nsọ.
V. Onyenweanyị nọnyere ụnụ.
R. Nọnyekwara mmụọ gị.
V. Welite nụ obi ụnụ elu.
R. Anyị ewelitela ha n'ebe Dinwenụ nọ.
V. Ka anyị nye nụ Dinwenụ Chukwu anyị ekele.
R. O kwesịrị, bụrụkwa ihe ziri ezi.
O kwesịrị ezie, bụrụkwa ihe ziri ezi, ọrụ dịịrị anyị,
na nzọpụta anyị,
na anyị ga-enye Gị ekele, oge niile,
na ebe niile, Dinwenụ, O Nna dị Nsọ,
Chineke ji ike niile, Onye dị ụwatụụwa,
site na Kristi Dinwenụ anyị.
Ya bụ ezi Ụkọchukwu dị ebighịebi.
mgbe O hiwere ụdị aja dị ebighịebi,
O bụ ụzọ chụnyere Gị Onwe Ya dị ka iheaja nzọpụta,
bịa nye anyị ịwu ka anyị na-achụ ya,
na ncheta nke Ya.
Mgbe anyị na-eri ahụ Ya O jiri chụọ aja maka anyị,
a na-eme ka anyị dị ike;
mgbe anyị na-añụkwa ọbara Ọ gbafuru maka anyị,
a na-anụcha anyị.
N'ihi nke a,
anyị na-eso ndị Mmụọọma na ndị Isimmụọọma,
ha na Ukpoeze, na Ikeọchịchị,
na igwe ndị agha niile nke eluigwe,
na-ekwe ukwe otito Gi akwụsịghị akwụsị na-asị :
Nsọ, Nsọ, Nsọ Oseburụwa Chineke nke igwe ndị agha...
Ọ bụrụ na a ga-ekpe Ekpere Yukarịstịa nke Rom n'ime Oriri Ikpeazụ nke Dinwenụ, a ga-ekpekwa ekpere Mmekọrịta Anyị na Ndị Nsọ pụrụ iche, ekpere "Nhanye Onyinye", (Hanc Igitur) na ekpere “Onye Bịara N'ụbọchị Bọrọ Ụbọchị Ọ Tara Ahụhụ” (Qui Pridie) nke aka ya dịka ọ dị n'ihu 200…