MBUGO N'ELUIGWE NKE MARỊA DỊ NGỌZỊ
MMALITE EKPERE YUKARỊSTỊA
NNUKWU MMEMME PURU ICHE
MBUGO N'ELUIGWE NKE MARỊA DỊ NGỌZỊ
(ỌGỌSTỤ 15)
OTITO NKE MARỊA E BUGORO N'ELUIGWE
V. Onyenweanyị nọnyere ụnụ.
R. Nọnyekwara mmụọ gị.
V. Welite nụ obi ụnụ elu.
R. Anyị ewelitela ha n'ebe Dinwenụ nọ.
V. Ka anyị nye nụ Dinwenụ Chukwu anyị ekele.
R. O kwesịrị, bụrụkwa ihe ziri ezi.
O kwesịrị ezie, bụrụkwa ihe ziri ezi, ọrụ dịịrị anyị,
na nzọpụta anyị,
na anyị ga-enye Gị ekele, oge niile,
na ebe niile, Dinwenụ, O Nna dị Nsọ,
Chineke ji ike niile, Onye dị ụwatụụwa,
site na Kristi Dinwenụ anyị.
N'ihi na taa, e bugoro Vejin nne nke Chukwu n'eluigwe,
Onye bụ mmalite na ụdị ihe Nzukọ Gị ga-abụ ma o zuo oke.
Ọ bụkwa akara nke olileanya kwesịrị ntụkwasịobi
na agbamume maka ndị nke Gị nọ n'ije.
I mere nke ọma, na o nweghị mgbe o ji bụrụ uche Gị
ka Ọ hụ ure nke ili, Onye mụrụ nwa Gị weere ahụ,
n'ụzọ ọnụ enweghị ike ikwuwunụ, bụ Isintọala ndụ niile.
N'ihi nke a,
Anyị na-eso otuukwe ndị Mmụọọma,
na-eto Gị, were ọñụ na-ekwuwapụta:
Nsọ, Nsọ, Nsọ Oseburụwa Chineke nke igwe ndị agha...