EMUME NGAFERE I
MMALITE EKPERE YUKARỊSTỊA
EMUME NGAFERE I
IHEOMIMI NKE NGAFERE
Ana-ekpe nke a n'oge Emume Ngafere. Na Misa nche nke oriri Ngafere, a ga-ekpe etu a : Ma ọ kachasị mkpa n'uchichi a... Malite n'ụbọchị Oriri Ngafere na n'ụbọchị ndị dị n'ime izeemumeabalịasatọ. a ga-ekpe : Ma ọ kachasị mkpa n'ụbọchị taa... A gafechaa izeemumeabalịasatọ a, a ga-ekpe: Ma ọ kachasị mkpa n'oge ugbua...
V. Onyenweanyị nọnyere ụnụ.
R. Nọnyekwara mmụọ gị.
V. Welite nụ obi ụnụ elu.
R. Anyị ewelitela ha n'ebe Dinwenụ nọ.
V. Ka anyị nye nụ Dinwenụ Chukwu anyị ekele.
R. O kwesịrị, bụrụkwa ihe ziri ezi.
O kwesịrị ezie, bụrụkwa ihe ziri ezi, ọrụ dịịrị anyị,
na nzọpụta anyị,
na anyị ga-eto Gị, oge niile, O Oseburụwa.
Ma ọ kachasị mkpa n'uchichi a
(n'ụbọchị taa) (n'oge ugbua)
ịja Gị mma n'ụzọ ka dị ebube,
mgbe Kristi, Onye bu Ngafere anyị,
bụzi ihe e jiri chụ aja.
N'ihi na Ya Onwe Ya bụ ezi Nwaatụrụ,
Onye kpochapụrụ njọ nke ụwa;
Onye sitere n'ọnwụ nke Ya
bibie ọnwụ nke anyị ;
bịa sikwa na mbilitenọnwụ Ya
nyeghachi anyị ndụ.
N'ihi nke a,
ebe ọ bụ na añụrị nke Ngafere jupụtara ebe niile,
ụwa dum na mmadụ niile na-egori,
Ike niile nke igwe na nke ndị Mmụọọma
na-ekwekwa ukwe otito Gị ebighịebi na-asị :
Nsọ, Nsọ, Nsọ Oseburụwa Chineke nke igwe ndị agha...
Ọ bụrụ na a ga-ekpe Ekpere Yukarịstịa Nke Rom, a ga-ekpe Ekpere Mmekọrịta Anyị Na Ndị Nsọ na Ekpere Nhanye Onyinye pụrụ iche dị ka o siri dị n'ihuakwụkwọ...
Na Misa nche nke Oriri Ngafere, a na-ekpe : n'uchichi a kachasị nsọ anyị na-eme emume...