NDỊ NWỤRỤ ANWỤ IV
MMALITE EKPERE YUKARỊSTỊA
NDỊ NWỤRỤ ANWỤ IV
NDỤ NKE ỤWA NA-AGBABANYE N'OTITO NKE ELUIGWE
A na-ekpe nke a na Misa maka ndị nwụrụ anwụ.
V. Onyenweanyị nọnyere ụnụ.
R. Nọnyekwara mmụọ gị.
V. Welite nụ obi ụnụ elu.
R. Anyị ewelitela ha n'ebe Dinwenụ nọ.
V. Ka anyị nye nụ Dinwenụ Chukwu anyị ekele.
R. O kwesịrị, bụrụkwa ihe ziri ezi.
O kwesịrị ezie, bụrụkwa ihe ziri ezi, ọrụ dịịrị anyị,
na nzọpụta anyị,
na anyị ga-enye Gị ekele, oge niile,
na ebe niile, Dinwenụ, O Nna dị Nsọ,
Chineke ji ike niile, Onye dị ụwatụụwa.
Ọ bụ site na ntimiwu Gị ka e si amụ anyi,
Atụmatụ Gị ana-eduzi anyị ;
sitekwa n'iwu I tiri n'ụwa nke e sitere na ya kpụọ anyị
ka anyị si enweta ntọhapụ na njọ.
A bịakwa, anyị bụ ndị e si n'ọnwụ nke Nwa Gị gbapụta
abụrụ ndị a na-akpọbata
n'otito nke mbilitenọnwụ Ya site n'iwu Gị.
N'ihi nke a,
Anyị na-eso igwe ndị Mmụọọma na kwa Ndịnsọ
na-ekwe ukwe otito Gị oge niile, na-asị :
Nsọ, Nsọ, Nsọ Oseburụwa Chineke nke igwe ndị agha..