IZUGBE III
MMALITE EKPERE YUKARỊSTỊA
IZUGBE III
ỊJA CHUKWU MMA MAKA OKIKE NA MKPỤGHARỊ MMADỤ
A na-ekpe nke a na Misa ndị na-enweghị Mmalite Ekpere Yukarịstịa nke aka ha. E nwekwara ike ikpe ya na misa ndị ọ na-abụghị iwu na a ga-ekperịrị Mmalite Ekpere Yukarịstịa nke oge emume.
V. Onyenweanyị nọnyere ụnụ.
R. Nọnyekwara mmụọ gị.
V. Welite nụ obi ụnụ elu.
R. Anyị ewelitela ha n'ebe Dinwenụ nọ.
V. Ka anyị nye nụ Dinwenụ Chukwu anyị ekele.
R. O kwesịrị, bụrụkwa ihe ziri ezi.
O kwesịrị ezie, bụrụkwa ihe ziri ezi,ọrụ dịịrị anyị,
na nzọpụta anyị,
na anyị ga-enye Gị ekele, oge niile,
na ebe niile, Dinwenụ, O Nna dị Nsọ,
Chineke ji ike niile, Onye dị ụwatụụwa:
I sitere na Nwa Gị Ị hụrụ n'anya kee mmadụ,
etua kwa ka I sitere na Ya kpụgharịa mmadụ,
Gị, onye obiọma na-enweghị ube.
Ya mere na o kwesịrị ekwesị
na ihe niile e kere eke na-efe Gị;
ndị niile a gbapụtarala na-eto Gị n'ụzọ ziri ezi;
Ndịnsọ Gi jikwa otu obi na-agọzi Gị.
N'ihi nke a,
Anyị na ndị Mmụọọma niile ji ukwe dị ụtọ,
na-eto Gị oge niile na-asị:
Nsọ, Nsọ, Nsọ Oseburụwa Chineke nke igwe ndị agha...