NTỤRỤIME N'EJIGHỊ NJỌ NKE VEJIN MARỊA
MMALITE EKPERE YUKARỊSTỊA
NNUKWU MMEMME PURU ICHE
NTỤRỤIME N'EJIGHỊ NJỌ NKE VEJIN MARỊA
DỊ NGỌZỊ
(DIS.8)
IHEOMIMI NKE MARỊA NA NKE NZUKỌ
V. Onyenweanyị nọnyere ụnụ.
R. Nọnyekwara mmụọ gị.
V. Welite nụ obi ụnụ elu.
R. Anyị ewelitela ha n'ebe Dinwenụ nọ.
V. Ka anyị nye nụ Dinwenụ Chukwu anyị ekele.
R. O kwesịrị, bụrụkwa ihe ziri ezi.
O kwesịrị ezie, bụrụkwa ihe ziri ezi, ọrụ dịịrị anyị,
na nzọpụta anyị,
na anyị ga-enye Gị ekele, oge niile,
na ebe niile, Dinwenụ, O Nna dị Nsọ,
Chineke ji ike niile, Onye dị ụwatụụwa :
I chekwabara Vejin Marịa kachasị nsọ
n'atụtụ ọbụla nke njọ e kere ụwa
ka o wee bụrụ na n'ime ya,
onye e ji uju nke amara Gị chọọ mma,
I ga-akwado nne tosiri etosi nke Nwa Gị,
ma kaakwa ya akara ime ka Ọ bụrụ mbido oriakụ
nke Nwa Gị bụ nzukọ na enweghị ihu ndọlị na ntụpọ
N'ihi na ya bụ vejin dịkarịsịrị ọcha ga-amụ nwa Gị,
onye bụ nwaatụrụ na-ebughị njọ,
nke na-ekpochapụ njọ anyị,
I siri n'etiti ihe niile e kere eke kwụba ya
ka ọ bụrụ maka ndị nke Gị,
ọnụ na-arịọta amara
na kwa onye a ga na-eñomi n'adịmnsọ.
N'ihi nke a,
Anyị na-eso otuukwe ndị Mmụọọma,
na-eto Gị, were ọñụ na-ekwuwapụta:
Nsọ, Nsọ, Nsọ Oseburụwa Chineke nke igwe ndị agha...