NDỊNCHEATỤRỤ DỊ NSỌ
MMALITE EKPERE YUKARỊSTỊA
NDỊNCHEATỤRỤ DỊ NSỌ
ỌNỤNỌ NDỊ NCHEATỤRU DI NSỌ NỌ N'IME NZUKỌ
A na-ekpe nke a na Nnukwu Mmemme Pụrụ Iche na Nnukwu Mmemme Ndị Ncheatụrụ dị Nsọ. Enwekwara ike ikpe ya na Mmemme Ncheta ha.
V. Onyenweanyị nọnyere ụnụ.
R. Nọnyekwara mmụọ gị.
V. Welite nụ obi ụnụ elu.
R. Anyị ewelitela ha n'ebe Dinwenụ nọ.
V. Ka anyị nye nụ Dinwenụ Chukwu anyị ekele.
R. O kwesịrị, bụrụkwa ihe ziri ezi.
O kwesịrị ezie, bụrụkwa ihe ziri ezi, ọrụ dịịrị anyị,
na nzọpụta anyị,
na anyị ga-enye Gị ekele, oge niile,
na ebe niile, Dinwenụ, O Nna dị Nsọ,
Chineke ji ike niile, Onye dị ụwatụụwa,
site na Kristi Dinwenụ anyị.
N'ihi na Ị na-enye Nzukọ Gị ntụziaka
iñuri n'oriri nke..... dị nsọ
Ị na-agbakwa Ya bụ Nzukọ Gị ume,
Site n'ụkpụrụ ezi ndụ ya.
Ị na-akụzịrị Nzukọ Gị ihe, site n'okwuchukwu ya.
Ị na-echekwaba Nzukọ Gị, site n'arịrịọ ya na-amasi Gị.
N'ihi nke a,
Anyị na-eso igwe ndị Mmụọọma na ndị Nsọ,
na-ekwe ukwe otito Gị ebighịebi na-asị :
Nsọ, Nsọ, Nsọ Oseburụwa Chineke nke igwe ndị agha...