DINWENỤ ANYỊ JESU KRISTI, EZE IZUGBE
MMALITE EKPERE YUKARỊSTỊA
NNUKWU MMEMME PỤRỤ ICHE
DINWENỤ ANYỊ JESU KRISTI, EZE IZUGBE
KRISTI, EZE IZUGBE
V. Onyenweanyị nọnyere ụnụ.
R. Nọnyekwara mmụọ gị.
V. Welite nụ obi ụnụ elu.
R. Anyị ewelitela ha n'ebe Dinwenụ nọ.
V. Ka anyị nye nụ Dinwenụ Chukwu anyị ekele.
R. O kwesịrị, bụrụkwa ihe ziri ezi.
O kwesịrị ezie, bụrụkwa ihe ziri ezi, ọrụ dịịrị anyị,
na nzọpụta anyị,
na anyị ga-enye Gị ekele, oge niile,
na ebe niile, Dinwenụ, O Nna dị Nsọ,
Chineke ji ike niile, Onye dị ụwatụụwa.
I tere sọ otu Nwa Gị,
Dinwenụ anyị Jesu Kristi,
Ụkọchukwu dị ebighịebi
na Eze nke izugbe, mmanụ ọnụ :
ka Ọ ga-abụ,
O were Onwe ya na-achụ aja n'ekwuaja nke obe.
Aja enweghị atụtụ na-eweta udo,
O mejupụta iheomimi nke nzọpụta mmadụ.
Mgbe e wetechara ihe niile e kere eke n'okpuru Ya;
Ọ ga-ahanyere ebubeeze Gị na enweghị atụ,
Alaeze dị ọkpụ, zuru ụwa niile, nke bụ:
Alaeze nke eziokwu na ndụ;
Alaeze nke ịdị nsọ na amara;
Alaeze nke ikpenkwụmọtọ, ịhụnanya na udo.
N'ihi nke a,
Anyị na-eso ndị Nsọ na ndị Mmụọọma na ndị Isimmụọọma
na Ukpoeze na Ikeọchịchị
na kwa igweagha niile nke eluigwe
na-ekwe ukwe otito Gị akwusịghị akwụsị na-asị :
Nsọ, Nsọ, Nsọ Oseburụwa Chineke nke igwe ndị agha...