IZUGBE V
MMALITE EKPERE YUKARỊSTỊA
IZUGBE V
NKWUWAPỤTA IHEOMIMI NKE KRISTI
A na-ekpe nke a na Misa ndị na-enweghị Mmalite Ekpere Yukarịstịa nke aka ha. E nwekwara ike ikpe ya na Misa ndị ọ na-abụghị iwu na a ga-ekperịrị Mmalite Ekpere Yukarịstịa nke oge emume.
V. Onyenweanyị nọnyere ụnụ.
R. Nọnyekwara mmụọ gị.
V. Welite nụ obi ụnụ elu.
R. Anyị ewelitela ha n'ebe Dinwenụ nọ.
V. Ka anyị nye nụ Dinwenụ Chukwu anyị ekele.
R. O kwesịrị, bụrụkwa ihe ziri ezi.
O kwesịrị ezie, bụrụkwa ihe ziri ezi, ọrụ dịịrị anyị,
na nzọpụta anyị,
na anyị ga-enye Gị ekele, oge niile,
na ebe niile, Dinwenụ, O Nna dị Nsọ,
Chineke ji ike niile, Onye dị ụwatụụwa,
site na Kristi Dinwenụ anyị.
Onye anyị ji ịhụnanya na-eme emume ncheta ọnwụ Ya,
jiri okwukwe dị ndụ na-ekwupụta mbilitenọnwụ Ya,
bịakwa jiri nchekwube kacha kwụdọsie ike na-atụ anya
mgbe Ọ ga-abịaghachi n'ebube.
N'ihi nke a,
Anyị na-eso ndị Nsọ na ndị Mmụọọma niile,
na-eto Gị ebighịebi na-asị :
Nsọ, Nsọ, Nsọ Oseburụwa Chineke nke igwe ndị agha...