ỤBỌCHỊ ONYENWEANYỊ VIII
MMALITE EKPERE YUKARỊSTỊA
ỤBỌCHỊ ONYENWEANYỊ VIII
NZUKỌ SITERE N'ỊDỊNOTU NKE ATỌNOTU DỊ NGỌZI
A na-ekpe nke a n'ụbọchị Sọndee niile na-adanyeghị n'oge emume pụrụ iche dị n'afọ.
V. Onyenweanyị nọnyere ụnụ.
R. Nọnyekwara mmụọ gị.
V. Welite nụ obi ụnụ elu.
R. Anyị ewelitela ha n'ebe Dinwenụ nọ.
V. Ka anyị nye nụ Dinwenụ Chukwu anyị ekele.
R. O kwesịrị, bụrụkwa ihe ziri ezi.
O kwesịrị ezie, bụrụkwa ihe ziri ezi, ọrụ dịịrị anyị,
na nzọpụta anyị,
na anyị ga-enye Gị ekele, oge niile,
na ebe niile, Dinwenụ, O Nna dị Nsọ,
Chineke ji ike niile, Onye dị ụwatụụwa.
N'ihi na ọ masịrị Gị,
Isite n'ọbara nke Nwa Gị na n'ike nke Mmụọ Nsọ,
Kpokọtakwa ọnụ ọzọ n'ime Gị,
ụmụ Gị ndị arụ nke njọ wetere aka.
Ka ndị mmadụ a kpọkọtara ọnụ,
site n'idinotu nke Atọnotu dị Ngọzi,
maka otito nke ụba amamihe Gị,
bụrụ ndị a matara na ha bụ Nzukọ,
Ahụ Kristi na Ụlọobibi nke Mmụọ Nsọ.
N'ihi nke a,
Anyị na-eso ndị Mmụọọma nọ n'ukwe
were añụrị na ekwupụta otito Gị na-asị :
Nsọ, Nsọ, Nsọ Oseburụwa Chineke nke igwe ndị agha...