IZUGBE VI
MMALITE EKPERE YUKARỊSTỊA
IZUGBE VI
IHEOMIMI NKE NZỌPỤTA DỊ N'IME KRISTI
A na-ekpe nke a na Misa ndị na-enweghị Mmalite Ekpere Yukarịstịa nke aka ha. E nwekwara ike ikpe ya na Misa ndị ọ na-abụghị iwu na a ga-ekperịrị Mmalite Ekpere Yukarịstịa nke oge emume.
V. Onyenweanyị nọnyere ụnụ.
R. Nọnyekwara mmụọ gị.
V. Welite nụ obi ụnụ elu.
R. Anyị ewelitela ha n'ebe Dinwenụ nọ.
V. Ka anyị nye nụ Dinwenụ Chukwu anyị ekele.
R. O kwesịrị, bụrụkwa ihe ziri ezi.
O kwesịrị ezie, bụrụkwa ihe ziri ezi, ọrụ dịịrị anyị,
na nzọpụta anyị,
na anyị ga-enye Gị ekele, oge niile,
na ebe niile, O Nna dị nsọ,
site na Nwa Gị Ị hụrụ n'anya bụ Jesu Kristi.
Okwu Gị I si na Ya mee ihe dum,
Onye I zitere ka Ọ bụụrụ anyị
Onyenzọpụta na Onyemgbapụta.
O weere ahụ site na Mmụọ Nsọ,
A mụọ Ya na Vejin.
N'imejupụta uche Gị,
na ịgbatara Gị ndị nke Gị dị nsọ,
Ọ gbasara aka n'ahụhụọnwụ
iji dọbie ụdọ nke ọnwụ na igosịpụta mbilitenọnwụ.
N'ihi nke a,
Anyị na-eso ndị Mmụọọma na ndị Nsọ niile,
na-ekwupụta ebube Gị, were otu olu na-asị :
Nsọ, Nsọ, Nsọ Oseburụwa Chineke nke igwe ndị agha...