MWEREAHỤ NKE DINWENỤ ANYỊ
MMALITE EKPERE YUKARỊSTỊA
NNUKWU MMEMME PỤRỤ ICHE
MWEREAHỤ NKE DINWENỤ ANYỊ
(MAACHỊ 25)
IHEOMIMI MWEREAHỤ
V. Onyenweanyị nọnyere ụnụ.
R. Nọnyekwara mmụọ gị.
V. Welite nụ obi ụnụ elu.
R. Anyị ewelitela ha n'ebe Dinwenụ nọ.
V. Ka anyị nye nụ Dinwenụ Chukwu anyị ekele.
R. O kwesịrị, bụrụkwa ihe ziri ezi.
O kwesịrị ezie, bụrụkwa ihe ziri ezi, ọrụ dịịrị anyị,
na nzọpụta anyị,
na anyị ga-enye Gị ekele, oge niile,
na ebe niile, Dinwenụ, O Nna dị Nsọ,
Chineke ji ike niile, Onye dị ụwatụụwa,
site na Kristi Dinwenụ anyị.
Onye Vejin ji okwukwe nabata
ozi nke Mmụọọzi si n'igwe,
na a ga-amụ Ya
site n'ike nke Mmụọ Nsọ n'etiti ụmụ mmadụ
na maka ọdịmma nke ha.
O jiri ịhụnanya buo Ya n'afọ nke n'enweghị atụtụ,
ka eziokwu dị na nkwa e kwere ụmụ Izrel mejupụta,
na kwa ka Ntụmaanya ndị mba ọzọ pụta ihe,
na a ga-emejupụta ya n'ụzọ ọnụ enweghị ike ikwuwunụ,
Site na Ya,
Igweagha ndị Mmụọọma na-esekpụrụ ebubeeze Gị,
nọrọ n'ihu Gị na-enwe ọñụ dị ebighịebi.
Anyị na-arịọ Ka I kwe ka anyị tinyekọọ olu anyị na nke ha,
were otu olu na-ekwe ukwe ọñụ, na-asị :
Nsọ, Nsọ, Nsọ Oseburụwa Chineke nke igwe ndị agha...