NKE ODIDO NSỌ ỤLỌNZUKỌ
MMALITE EKPERE YUKARỊSTỊA
NKE ODIDO NSỌ ỤLỌNZUKỌ
IHEOMIMI ỤLỌNSỌ CHINEKE
V. Onyenweanyị nọnyere ụnụ.
R. Nọnyekwara mmụọ gị.
V. Welite nụ obi ụnụ elu.
R. Anyị ewelitela ha n'ebe Dinwenụ nọ.
V. Ka anyị nye nụ Dinwenụ Chukwu anyị ekele.
R. O kwesịrị, bụrụkwa ihe ziri ezi.
O kwesịrị ezie, bụrụkwa ihe ziri ezi, ọrụ dịịrị anyị,
na nzọpụta anyị,
na anyị ga-enye Gị ekele, oge niile,
na ebe niile, O Nna dị nsọ.
I mere ụwa niile ụlọnsọ nke ebube Gị
ka e wee na-edo Aha Gị ebube n'ebe niile.
Mana Ị naghị ajụ ka e nwee ebe kwesịrị ekwesị
e dooro Gị nsọ maka mmemme ihe omimi Gị.
Ya bu: anyị ji nnukwu ọñụ agọnyere Gị
ụlọekpere nke a bụ ọrụaka mmadụ,
maka otito nke ebube Gị.
Ebe a ka a na-ahụ n'inyogoinyogo
ihe omimi ezi ụlọnsọ Gị,
na òtù Jerusalem nke eluigwe ga-adị ;
maka I mere ahụ Nwa Gị nke a mụrụ na Vejin Marịa,
ka Ọ bụrụ ụlọnsọ a gọnyeere Gị,
ebe uju nke Abụmchukwu Gị ga-eji mere ebe obibi.
Ma I hiwere nzukọ Gị dịka obodo nsọ
e wubere n'elu ntọala ndị Apọstụl,
nke Jesu Kristi n'onwe Ya bụ Isiide ji ụlọ.
Otu Nzukọ ahụ
ka a ga-eji okwute ndị a họtara ahọta ewulite,
ndị nwere ndụ site na Mmụọ Nsọ,
e jikọrọ ọnụ site n'ịhụnanya,
Ebe Ị ga-abụ Okwuchaaọgwụ'n'ihe niile ruo ụwatụụwa,
ihè Kristi achawapụta ebighịebi.
Site na ya, O Dinwenụ,
Anyị na-eso ndị Mmụọọma na ndị Nsọ niile
jiri oñụ na-ekwupụta otito Gị na-asị :
Nsọ, Nsọ, Nsọ Oseburụwa Chineke nke igwe ndị agha...