ALỤMDINANWUNYE NDỊ OTU KRISTI II
MMALITE EKPERE YUKARỊSTỊA
ALỤMDINANWUNYE NDỊ OTU KRISTI II
NNUKWU AMANSỌ ALỤMDINANWUNYE
V. Onyenweanyị nọnyere ụnụ.
R. Nọnyekwara mmụọ gị.
V. Welite nụ obi ụnụ elu.
R. Anyị ewelitela ha n'ebe Dinwenụ nọ.
V. Ka anyị nye nụ Dinwenụ Chukwu anyị ekele.
R. O kwesịrị, bụrụkwa ihe ziri ezi.
O kwesịrị ezie, bụrụkwa ihe ziri ezi, ọrụ dịịrị anyị,
na nzọpụta anyị,
na anyị ga-enye Gị ekele, oge niile,
na ebe niile, Dinwenụ, O Nna dị Nsọ,
Chineke ji ike niile, Onye dị ụwatụụwa,
site na Kristi Dinwenụ anyị.
Gị na ndị nke Gị gbara ndụ ọhụrụ
bụ ndị ahụ Ị gbapụtara, site n'ihe omimi
nke ọnwọ na mbilitenọnwụ Kristi
ka Ị were mee ka ha keta oke n'ụdị Gị n'ime Kristi,
bịakwa keta ekpe otito Ya n'eluigwe.
I gosịrị ụba ịhụnanya nke amara Gị na-enweghị ube
site na njikọ nke nwoke na nwaanyị
ka ya bụ amansọ wee kpọchighaa anyị na nzube ịhụnanya Gị dị ukwuu
nke Ọ na-egosị.
N'ihi nke a, anyị na-eso ndị Mmụọọma
na Ndịnsọ niile na-eto Gị
akwụsịghị akwụsị na-asị:
Nsọ, Nsọ, Nsọ Oseburụwa Chineke nke igwe ndị agha...