N'ECHIMECHI ỤKỌCHUKWU
MMALITE EKPERE YUKARỊSTỊA
N'ECHIMECHI ỤKỌCHUKWU
ABỤM ỤKỌCHUKWU KRISTI NA AGBAMODIBỌ NKE NDỊ ỤKỌCHUKWU
V. Onyenweanyị nọnyere ụnụ.
R. Nọnyekwara mmụọ gị.
V. Welite nụ obi ụnụ elu.
R. Anyị ewelitela ha n'ebe Dinwenụ nọ.
V. Ka anyị nye nụ Dinwenụ Chukwu anyị ekele.
R. O kwesịrị, bụrụkwa ihe ziri ezi.
O kwesịrị ezie, bụrụkwa ihe ziri ezi, ọrụ dịịrị anyị,
na nzọpụta anyị,
na anyị ga-enye Gị ekele, oge niile,
na ebe niile, Dinwenụ, O Nna dị Nsọ,
Chineke ji ike niile, Onye dị ụwatụụwa.
Site na ntémúdé nke Mmụọ Nsọ
I mere sọ otu Nwa Gị nnukwu Ụkọchukwu
nke ọgbụgba ndụ ohụrụ dị ebighịebi.
N'obiọma Gị pụrụ iche,
Ọ masịkwara Gị ime ka Ụkọchukwu Ya
Dịgide n'ime Nzukọ.
N'ihi na Ọ bụghị naanị na O bugoro ndị Ọ gbatara agbata
n'ọnọdụ ịbụ Ụkọchukwu nọ n'ọkwaeze,
kama O sitekwara n'obinwanne O nwere
si n'etiti ha họpụta ndị ga-eketa oke
n'igba odibọ nke Ya dị nsọ site na mbikwasị aka n'isi.
Ha ga-eji Aha Ya na-achụnwokwa
otu aja nke mgbapụta mmadụ
mgbe ha na-akwadoro ụmụ Gi Oriri nke Ngafere,
jirikwa ịhụnanya na-edo ndị nke Gị nsọ,
were okwu na-azụ ha nri,
were àmànsọ ga na-edo ha ike.
Ka ọ ga-abụ, ha were ndụ ha nye maka Gị
na maka nzọpụta ụmụnne ha,
ha ana-agba mbọ ịdị n'ụdị Kristi n'onwe Ya;
na-egosikwa gị kwụdosie ike na ịhụnanya mgbe niile.
N'ihi nke a, O Dinwenụ,
Anyị na-eso ndị Mmụọọma na ndi Nsọ niile
na-ekwupụta Aha Gị, were ọñụ na-asị :
Nsọ, Nsọ, Nsọ Oseburụwa Chineke nke igwe ndị agha...