NRỌGO N'ELUIGWE ONYENWEANYỊ I
MMALITE EKPERE YUKARỊSTỊA
NRỌGO N'ELUIGWE ONYENWEANYỊ I
IHEOMIMI NKE NRỌGO N'ELUIGWE
A na-ekpe nke a n'ụbọchị emume Nrogo n'eluigwe Onyenweanyị. E nwekwara ike ikpe ya bido n'ụbọchị ndị so Nrogo n'eluigwe nke Onyenweanyị wee rute na Satọdee tupu mmemme Pentịkọstụ, n'ime Misa ndị na-enweghị Mmalite Ekpere Yukarịstịa nke aka ha.
V. Onyenweanyị nọnyere ụnụ.
R. Nọnyekwara mmụọ gị.
V. Welite nụ obi ụnụ elu.
R. Anyị ewelitela ha n'ebe Dinwenụ nọ.
V. Ka anyị nye nụ Dinwenụ Chukwu anyị ekele.
R. O kwesịrị, bụrụkwa ihe ziri ezi.
O kwesịrị ezie, bụrụkwa ihe ziri ezi, ọrụ dịịrị anyị,
na nzọpụta anyị,
na anyị ga-enye Gị ekele, oge niile,
na ebe niile, Dinwenụ, O Nna dị Nsọ,
Chineke ji ike niile, Onye dị ụwatụụwa :
N'ihi na Dinwenụ Jesu,Eze nke otito,
Onye meriri njọ na ọnwụ, rogooro n'igwe kacha elu (taa),
ka ndị Mmụọọma ji ọñụ ịtụnanya na-ele Ya.
Ụkọ n'etiti Chineke na mmadụ,
Ọkaikpe nke ụwa na Dinwenụ nke igwendịagha ;
O bu ụzọ gawa,
Ọ bụghị ka O kewapụ onwe Ya n'ịdị ala nke anyị,
kama ka obi sie anyị bụ akụkụ ahụ ya ike,
na anyị ga-eru ebe ahụ
Ya onwe Ya bụ Isi na Mbido anyị rugoro.
N'ihi nke a,
ebe ọ bụ na añụrị nke Ngafere jupụtara ebe niile,
Ụwa dum na mmadụ niile na-egori,
Ike niile nke igwe na nke ndị Mmụọọma
na-ekwekwa ukwe otito Gị ebighịebi na-asị :
Nsọ,Nsọ,Nsọ Oseburụwa Chineke nke igwe ndị agha...
N'ụbọchị Nrogo n'eluigwe Onyenweanyị, Ọ bụrụ na a ga-ekpe Ekpere Yukarịstịa Nke Rom, a ga-ekpe ekpere Mmekọrịta Anyị Na Ndị Nsọ nke aka ya dị ka o siri dị n'ihuakwụkwọ..