NKE OBI JESU KACHASỊ NSỌ
MMALITE EKPERE YUKARỊSTỊA
NNUKWU MMEMME
NKE OBI JESU KACHASỊ NSỌ
MAKA ỊHỤNANYA KRISTI NA-ENWEGHỊ ATỤ
V. Onyenweanyị nọnyere ụnụ.
R. Nọnyekwara mmụọ gị.
V. Welite nụ obi ụnụ elu.
R. Anyị ewelitela ha n'ebe Dinwenụ nọ.
V. Ka anyị nye nụ Dinwenụ Chukwu anyị ekele.
R. O kwesịrị, bụrụkwa ihe ziri ezi.
O kwesịrị ezie, bụrụkwa ihe ziri ezi, ọrụ dịịrị anyị,
na nzọpụta anyị,
na anyị ga-enye Gị ekele, oge niile,
na ebe niile, Dinwenụ, O Nna dị Nsọ,
Chineke ji ike niile, Onye dị ụwatụụwa,
Site na Kristi Dinwenụ anyị.
Onye mgbe e welitere ya n'Obe,
jiiri ịhụnanya na-enweghị atụ,
were onwe Ya nye maka anyị,
sikwa n'akụkụ Ya e ji úbè mapu wụpụ ọbara na mmiri,
ebe Amansọ ga nke Nzukọ si hupụta,
ka mmadụ niile
a ga-adọbatara n'obi gheere oghe nke Onyenzọpụta,
nwee ike iji ọñụ sere mmiri mgbe niile
n'isiiyi nke nzọpụta.
N'ihi nke a,
Anyị na-eso ndị Nsọ na ndị Mmụọọma niile
na-eto Gị akwụsịghị akwụsị na-asị:
Nsọ, Nsọ, Nsọ Oseburụwa Chineke nke igwe ndị agha...