NDỊ NWỤRỤ ANWỤ II
MMALITE EKPERE YUKARỊSTỊA
NDỊ NWỤRỤ ANWỤ II
KRISTI NWỤRỤ MAKA NDỤ ANYỊ
A na-ekpe nke a na Misa maka ndị nwụrụ anwụ.
V. Onyenweanyị nọnyere ụnụ.
R. Nọnyekwara mmụọ gị.
V. Welite nụ obi ụnụ elu.
R. Anyị ewelitela ha n'ebe Dinwenụ nọ.
V. Ka anyị nye nụ Dinwenụ Chukwu anyị ekele.
R. O kwesịrị, bụrụkwa ihe ziri ezi.
O kwesịrị ezie, bụrụkwa ihe ziri ezi, ọrụ dịịrị anyị,
na nzọpụta anyị,
na anyị ga-enye Gị ekele, oge niile,
na ebe niile, Dinwenụ, O Nna dị Nsọ,
Chineke ji ike niile, Onye dị ụwatụụwa,
site na Kristi Dinwenụ anyị.
N'ihi na Ya onwe Ya bụ otu onye ahụ nabatara ọnwụ
ka anyị niile wee ghara ịnwụ.
N'ezie, Ya bụ otu onye họọrọ ịnwụ ọnwụ,
ka anyị niile wee dịịrị Gị ndụ ebighịebi.
N'ihi nke a,
Anyị na-eso òtúukwe ndị Mmụọọma,
Were ọñụ na-eto Gị na-asị :
Nsọ, Nsọ, Nsọ Oseburụwa Chineke nke igwe ndị agha..