ỤBỌCHỊ ONYENWEANYỊ II
MMALITE EKPERE YUKARỊSTỊA
ỤBỌCHỊ ONYENWEANYỊ II
IHEOMIMI NKE NZỌPỤTA
A na-ekpe nke a n'ụbọchị Sọndee niile na-adanyeghị n'oge emume pụrụ iche dị n'afọ.
V. Onyenweanyị nọnyere ụnụ.
R. Nọnyekwara mmụọ gị.
V. Welite nụ obi ụnụ elu.
R. Anyị ewelitela ha n'ebe Dinwenụ nọ.
V. Ka anyị nye nụ Dinwenụ Chukwu anyị ekele.
R. O kwesịrị, bụrụkwa ihe ziri ezi.
O kwesịrị ezie, bụrụkwa ihe ziri ezi, ọrụ dịịrị anyị,
na nzọpụta anyị,
na anyị ga-enye Gị ekele, oge niile,
na ebe niile, Dinwenụ O Nna dị Nsọ,
Chineke ji ike niile, Onye dị ụwatụụwa,
site na Kristi Dinwenụ anyị.
Onye jiri ihi ebere O nwere
naka mmehie mmadụ,
wedata onwe Ya, a mụọ Ya na Vejin Marịa.
Ọ tara ahụhụọnwụ n'elu obe,
gbapụta anyị n'ọnwụ ebighịebi,
ka O si na ndị nwụrụ anwụ na-ebilite,
O nyere anyị ndụ ebighịebi.
N'ihi nke a,
Anyị na-eso ndị Mmụọọma na ndịisi Mmụọọma,
Ha na Ukpoeze, na Ikeọchịchị
na kwa igwe ndịagha niile nke eluigwe,
na-ekwe ukwe otito Gị, akwụsịghị akwụsị na-asị :
Nsọ, Nsọ, Nsọ Oseburụwa Chineke nke igwe ndị agha...