IZUGBE IV
MMALITE EKPERE YUKARỊSTỊA
IZUGBE IV
ỊJA CHUKWU MMA BỤ ONYINYE YA
A na-ekpe nke a na Misa ndị na-enweghị Mmalite Ekpere Yukarịstịa nke aka ha. E nwekwara ike ikpe ya na Misa ndị ọ na-abụghị iwu na a ga-ekperịrị Mmalite Ekpere Yukarịstịa nke oge emume.
V. Onyenweanyị nọnyere ụnụ.
R. Nọnyekwara mmụọ gị.
V. Welite nụ obi ụnụ elu.
R. Anyị ewelitela ha n'ebe Dinwenụ nọ.
V. Ka anyị nye nụ Dinwenụ Chukwu anyị ekele.
R. O kwesịrị, bụrụkwa ihe ziri ezi.
O kwesịrị ezie, bụrụkwa ihe ziri ezi, ọrụ dịịrị anyị,
na nzọpụta anyị,
na anyị ga-enye Gị ekele, oge niile,
na ebe niile, Dinwenụ, O Nna dị Nsọ,
Chineke ji ike niile, Onye dị ụwatụụwa:
N'ihi na otito anyị na-eto Gị adịghị Gị mkpa.
Kama ekele anyị na-enye Gị bụ onyinye Gị.
Otito anyị na-enye Gị anaghị agbakwunye
ihe ọbụla n'ihe Ị bụ,
kama ọ na-ewetara anyị nzọpụta,
site na Kristi Dinwenụ anyị.
N'ihi nke a,
anyị na-eso òtú ukwe ndị Mmụọọma were ọñụ
na-eto Gị na-asị :
Nsọ, Nsọ, Nsọ Oseburụwa Chineke nke igwe ndị agha...