NDỊNSỌ E GBURU MAKA OKWUKWE I
MMALITE EKPERE YUKARỊSTỊA
NDỊNSỌ E GBURU MAKA OKWUKWE I
AKARA NA ỤKPỤRỤ NDỊ E GBURU MAKA OKWUKWE
A na-ekpe nke a na Nnukwu Mmemme Pụrụ Iche na Nnukwu Mmemme Ndịnsọ
e gburu maka okwukwe. E nwekwara ike ikpe ya na Mmemme Ncheta ha.
V. Onyenweanyị nọnyere ụnụ.
R. Nọnyekwara mmụọ gị.
V. Welite nụ obi ụnụ elu.
R. Anyị ewelitela ha n'ebe Dinwenụ nọ.
V. Ka anyị nye nụ Dinwenụ Chukwu anyị ekele.
R. O kwesịrị, bụrụkwa ihe ziri ezi.
O kwesịrị ezie, bụrụkwa ihe ziri ezi, ọrụ dịịrị anyị,
na nzọpụta anyị,
na anyị ga-enye Gị ekele, oge niile,
na ebe niile, Dinwenụ, O Nna dị Nsọ,
Chineke ji ike niile, Onye dị ụwatụụwa:
N'ihi na... dị ngọzị, e gburu maka ikwupụta aha Gị,
n'isoro nzọụkwụ Kristi,
ọbara Ọ kwafuru gosịpụtara ọrụ ebube Gị.
Etu a ka I si eme ka ike Gị pụta ihè na myọkasị mmadụ,
bịa na-enye adịghị ike mmadụ, adimike ịgbara Gị akaebe,
site na Kristi Dinwenụ anyị.
N'ihi nke a,
Anyị bụ ndị nọ n'ụwa na Ike niile nke eluigwe,
na-eto Gị oge niile,
were oke olu na-etiku ebubeeze Gị
akwụsịghị akwụsị na-asị :
Nsọ, Nsọ, Nsọ Oseburụwa Chineke nke igwe ndị agha...