ỤBỌCHỊ PENTIKỌSTỤ
MMALITE EKPERE YUKARỊSTỊA
NNUKWU MMEMME PỤRỤ ICHE NKE
ỤBỌCHỊ PENTIKỌSTỤ
IHE OMIMI NKE PENTIKOSTU
V. Onyenweanyị nọnyere ụnụ.
R. Nọnyekwara mmụọ gị.
V. Welite nụ obi ụnụ elu.
R. Anyị ewelitela ha n'ebe Dinwenụ nọ.
V. Ka anyị nye nụ Dinwenụ Chukwu anyị ekele.
R. O kwesịrị, bụrụkwa ihe ziri ezi.
O kwesịrị ezie, bụrụkwa ihe ziri ezi, ọrụ dịịrị anyị,
na nzọpụta anyị,
na anyị ga-enye Gị ekele, oge niile,
na ebe niile, Dinwenụ, O Nna dị Nsọ,
Chineke ji ike niile, Onye dị ụwatụụwa.
Taa, na mmejupụta mmemme iheomimi nke Ngafere,
I hunyere Mmụọ Nsọ n'ime ndị ahụ I mere ka ha bụrụ ụmụ Gị site na
njikọta nke ha na sọ otu Nwa Gị.
Na mmalite nke Nzukọ,
Mmụọ nsọ ahụ nyere mba niile onyinye
nke ịmata onye Chukwu bụ
bia jikọta asụsụ dị icheiche ọnụ
n'ikwupụta otu okwukwe.
N'ihi nke a,
ebe Ọ bụ na añụrị nke Ngafere juru ebe niile,
mmadụ niile nọ n'ụwa na-añụrị oke ọñụ.
Igwendịagha nke igwe na ike niile nke ndị Mmụọọma jikọtara ọnụ
na-eto ebube Gị, akwụsịghị akwụsị na-asị :
Nsọ, Nsọ, Nsọ Oseburụwa Chineke nke igwe ndị agha...