NDỊ NSỌ NIILE
MMALITE EKPERE YUKARỊSTỊA
NNUKWU MMEMME PỤRỤ ICHE
NDỊ NSỌ NIILE
(NỌV.1)
OTITO NKE NNE ANYỊ JERUSALEM
V. Onyenweanyị nọnyere ụnụ.
R. Nọnyekwara mmụọ gị.
V. Welite nụ obi ụnụ elu.
R. Anyị ewelitela ha n'ebe Dinwenụ nọ.
V. Ka anyị nye nụ Dinwenụ Chukwu anyị ekele.
R. O kwesịrị, bụrụkwa ihe ziri ezi.
O kwesịrị ezie, bụrụkwa ihe ziri ezi, ọrụ dịịrị anyị,
na nzọpụta anyị,
na anyị ga-enye Gị ekele, oge niile,
na ebe niile, Dinwenụ, O Nna dị Nsọ,
Chineke ji ike niile, Onye dị ụwatụụwa :
N'ihi na taa, I nyere anyị ohere ime Mmemme obodo Gị bụ Nne anyị
Jerusalem nke eluigwe
ebe igwè ụmụnne anyị nọrọgoro
na-enye Gị otito ebighịebi ;
ebe anyị bụ ndị no na njem ji okwukwe
were ọsọ na ije na-akpụdebe nso.
Anyị jikwa otu obi na-añụrị
maka mbuli elu ndị otu Nzukọ a dị ebube
nke I si na ya, n'otu aka ahụ,
enye adịghị ike anyị ume na ihenñomi.
N'ihi nke a,
Anyị na-eso igwe ha bụ ndị Nsọ na ndị Mmụọọma
na-ekwupụta ịdị ukwu Gị
were olu ịja mma na-eti mkpu :
Nsọ, Nsọ, Nsọ Oseburụwa Chineke nke igwe ndị agha..