MBULITENOOTITO NKE OBE DỊ NSỌ
MMALITE EKPERE YUKARỊSTỊA
NNUKWU MMEMME
MBULITENOOTITO NKE OBE DỊ NSỌ
(SEPT.14)
MMERI NKE OBE DỊ EBUBE
V. Onyenweanyị nọnyere ụnụ.
R. Nọnyekwara mmụọ gị.
V. Welite nụ obi ụnụ elu.
R. Anyị ewelitela ha n'ebe Dinwenụ nọ.
V. Ka anyị nye nụ Dinwenụ Chukwu anyị ekele.
R. O kwesịrị, bụrụkwa ihe ziri ezi.
O kwesịrị ezie, bụrụkwa ihe ziri ezi, ọrụ dịịrị anyị,
na nzọpụta anyị,
na anyị ga-enye Gị ekele, oge niile,
na ebe niile, Dinwenụ, O Nna dị Nsọ,
Chineke ji ike niile, Onye dị ụwatụụwa:
I hiwere mgbapụta mmadụ n'osisi nke obe,
ka ebe ahụ ọnwụ siri malite
bụrụkwa ebe ndụ ga-esi kulite;
ka ya bụ onye meriri n'osisi
bụrụkwa onye a ga-emeri n'osisi:
site na Kristi Dinwenụ anyị.
Onye ndị Mmụọọma si na Ya na-eto ebubeeze Gị,
Ikeọchịchị na-esekpuru Gị, Ike niile na-ama jijiji n'ihu Gị.
Ígwē na ike niile nke igwe na kwa Serafịm dị ngọzi,
Jikọtara aka ọnụ na mmemme oke ọñụ na-eto Gị.
Anyị na-arịọ ka I kwe ka anyị tinyekwuo olu anyị na nke ha,
were umeala na-eto Gị na-asị :
Nsọ, Nsọ, Nsọ Oseburụwa Chineke nke igwe ndị agha...