NDỊNSỌ II
MMALITE EKPERE YUKARỊSTỊA
NDỊNSỌ II
IHE NDỊ NSỌ NA-EME
A na-ekpe nke a na Misa nke "Ndịnsọ Nile", Ndịnsọ nlekota, ndị e jiri gụọ ụlọnzukọ aha, na kwa na Nnukwu mmemme Ndịnsọ Pụrụ Iche na Nnukwu Mmemme Ndịnsọ, Bereesọ nke nwere Mmalite Ekpere Yukarịstịa nke aka ya. E nwekwara ike ikpe ya na mmemme ncheta Ndịnsọ.
V. Onyenweanyị nọnyere ụnụ.
R. Nọnyekwara mmụọ gị.
V. Welite nụ obi ụnụ elu.
R. Anyị ewelitela ha n'ebe Dinwenụ nọ.
V. Ka anyị nye nụ Dinwenụ Chukwu anyị ekele.
R. O kwesịrị, bụrụkwa ihe ziri ezi.
O kwesịrị ezie, bụrụkwa ihe ziri ezi, ọrụ dịịrị anyị,
na nzọpụta anyị,
na anyị ga-enye Gị ekele, oge niile,
na ebe niile, Dinwenụ, O Nna dị Nsọ,
Chineke ji ike niile, Onye dị ụwatụụwa,
site na Kristi Dinwenụ anyị.
N'ihi na site na ija mma dị ịtụnanya nke Ndịnsọ Gị,
I na-eji ike gị dị ọhụrụ mgbe niile na-eme ka Nzukọ Gị
na-amịta mkpụrụ,
na-egosikwa anyị akara kachasị doo anya nke ịhụnanya Gị.
Tinyere nke a, iji mejupụta iheomimi nke nzọpụta a,
na-ajalite anyị site n'ụkpụrụ ha pụrụ iche,
na-enyekwara anyị aka,
site na-arịrịọ ha na arịọrọ anyị mgbe niile.
N'ihi nke a,
O Dinwenụ, anyị na ndị Mmụọọma na ndị Nsọ niile,
na-ekwupụta otito Gị, were oke ọñụ na-asị :
Nsọ, Nsọ, Nsọ Oseburụwa Chineke nke igwe ndị agha...