NDỊNSỌ I
MMALITE EKPERE YUKARỊSTỊA
NDỊNSỌ I
OTITO NKE NDỊNSỌ
A na-ekpe nke a na Misa nke "Ndịnsọ Niile", Ndịnsọ nlekota, ndị e jiri gụọ Ụlọnzụkọ aha, na kwa na Nnukwu Mmemme Ndịnsọ Pụrụ Iche na Nnukwu Mmemme Ndịnsọ, beeresọ nke nwere Mmalite Ekpere Yukarịstịa nke aka ya. E nwekwara ike ikpe ya na mmemme ncheta Ndịnsọ.
V. Onyenweanyị nọnyere ụnụ.
R. Nọnyekwara mmụọ gị.
V. Welite nụ obi ụnụ elu.
R. Anyị ewelitela ha n'ebe Dinwenụ nọ.
V. Ka anyị nye nụ Dinwenụ Chukwu anyị ekele.
R. O kwesịrị, bụrụkwa ihe ziri ezi.
O kwesịrị ezie, bụrụkwa ihe ziri ezi, ọrụ dịịrị anyị,
na nzọpụta anyị, na anyị ga-enye Gị ekele, oge niile,
na ebe niile, Dinwenụ, O Nna dị Nsọ,
Chineke ji ike niile, Onye dị ụwatụụwa:
Ọ bụ Gị ka a na-aja mma n'ogbakọ Ndịnsọ,
n'ihi na mgbe I tuwere eziomume ha ugo,
Ị na-akwanyere onyinye Gị ugwu.
I siri n'ụdị ndụ ha biri nye anyị ụkpụrụ anyị ga-eso,
site mmekọrịta anyị na ha nye anyị mgbakọaka,
bịakwa site n'arịrịo ha na-enyere anyị aka;
ka ọ ga-abụ site n'agbamume nke ọtụtụ ndị akaebe dị etu a,
Anyị abụrụ akwaakwụrụ n'ọgụ nke ndụ,
biakwa soro ha nweta okpueze nke otito
na-anaghị agbachu agbachu.
site na Kristi Dinwenụ anyị.
N'ihi nke a,
Anyị na-eso ndị Mmụọọma na ndị Isimmụọọma,
na imeriime ọgbakọ ndị Nsọ,
na-ekwe ukwe otito Gị akwụsịghị akwụsị na-asị :
Nsọ, Nsọ, Nsọ Oseburụwa Chineke nke igwe ndị agha...