NDI MMỤỌỌMA
MMALITE EKPERE YUKARỊSTỊA
NDI MMỤỌỌMA
OTITO CHINEKE SITE NA NDỊ MMỤỌỌMA
(A na-ekpe nke a ụbọchị Nnukwu Mmemme nke ndị Isimmụọọma (Sept. 29), na mmemme ncheta nke ndị Mmụọọma ndịnche (Okt.2)}
V. Onyenweanyị nọnyere ụnụ.
R. Nọnyekwara mmụọ gị.
V. Welite nụ obi ụnụ elu.
R. Anyị ewelitela ha n'ebe Dinwenụ nọ.
V. Ka anyị nye nụ Dinwenụ Chukwu anyị ekele.
R. O kwesịrị, bụrụkwa ihe ziri ezi.
O kwesịrị ezie, bụrụkwa ihe ziri ezi, ọrụ dịịrị anyị,
na nzọpụta anyị,
na anyị ga-enye Gị ekele, oge niile,
na ebe niile, Dinwenụ, O Nna dị Nsọ,
Chineke ji ike niile, Onye dị ụwatụụwa.
O kwesịkwara na n'ime ndị Isimmụọọma na ndị Mmụọọma Gị,
ukwe ọñụ agaghị akwụsịlata akwụsị.
N'ihi na ugwu nsọpụrụ a na-enye ndị Mmụọọma Gị e kere eke
na-egosịpụta ịdị ukwu na ebube Gị kachasị elu.
Ebe Ọ bụ na nsọpụrụ ha etu a dịịrị ha,
Ị na-egosị ka Gị onwe Gị si dị elu
bịa kachakwa ihe niile mma,
site na Kristi Dinwenụ anyị.
Site na ya,
igwe ndị Mmụọọma na-eto ebubeeze Gị.
Anyị na ha jikọtara ọnụ were ọñụ na-esekpuru Gị
were olu otito na-eti mkpu :
Nsọ, Nsọ, Nsọ Oseburụwa Chineke nke igwe ndị agha...