EMUME NGAFERE V
MMALITE EKPERE YUKARỊSTỊA
EMUME NGAFERE V
KRISTI ONYENCHỤAJA NA IHE E JIRI CHỤ AJA
A na-ekpe nke a n'oge emume Ngafere.
V. Onyenweanyị nọnyere ụnụ.
R. Nọnyekwara mmụọ gị.
V. Welite nụ obi ụnụ elu.
R. Anyị ewelitela ha n'ebe Dinwenụ nọ.
V. Ka anyị nye nụ Dinwenụ Chukwu anyị ekele.
R. O kwesịrị, bụrụkwa ihe ziri ezi.
O kwesịrị ezie, bụrụkwa ihe ziri ezi, ọrụ dịịrị anyị,
na nzọpụta anyị,
na anyị ga-eto Gị, oge niile, O Oseburụwa.
Ma Ọ kachasị mkpa n'oge ugbua,
ịja Gị mma n'ụzọ ka dị ebube,
mgbe Kristi, Onye bụ Ngafere anyị,
bụzi ihe e jiri chụ aja.
Onye sitere n'ihunye ahụ Ya,
meziri n'eziokwu nke obe
ka aja agbaochie niile nweta mmejupụta,
sitekwa n'inye Gị onwe Ya maka nzọpụta anyị,
O gosiri onwe Ya ka ụkọchukwu, ekwuaja na nwaatụrụ e jiri chụ aja.
N'ihi nke a,
ebe Ọ bụ na añụrị nke Ngafere jupụtara ebe niile,
ụwa dum na mmadụ niile na-egori,
Ike niile nke igwe na nke ndị Mmụọọma
na-ekwekwa ukwe otito Gị ebighịebi na-asị :
Nsọ, Nsọ, Nsọ Oseburụwa Chineke nke igwe ndị agha…..